ALAỌ̀MÁJIJIJI: NDI MAITAMA, ABỤJA CHỊZI OBI N’AKA
Abuja – Alaọ̀májijiji nta (earth tremor) emewo ka ndi bi n’ógbè ụfọdụ n’Abụja bụ isiobodo Naịjiriya dịka Maitama, Mpape na Katampe chịrị obi n’aka.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ya bụ alaọ̀májijiji nke malitere kemgbe ngwụcha izu ụka gara aga akwụsịbeghi ruo ugbua.
N’ezie, alaọ̀májijiji nta anaghị akpa mkpamkpa dịka alaọ̀májijiji (earthquake) mana ọ na-ebutekwa nnukwu mmapụ obi na égwù.
Oge ikpeazụ ihe a mere bụ n’afọ 2018, oge ruru ógó 3.2 na ngwa nnyocha alaọ̀májijiji bụ Ritcher Scale mere na Mpape. Oge ahụ, Gọọmentị kwuru na ụjọ ọbụla adịghị, na ndi mmadụ ekwesịghị ịkụja.
Kaosiladị, Gọọmentị ekwubeghi ihe ọbụla na nkea.
hmmmm! Ọ kwa “Chi zọba”. A na-ekwu na ọrịa ezughi oke, a sị ndi dara ibi ha too afọ. A na -ekwu na agụụ karịrị n’obodo, mazịara ka ọ ga-adị ma alaọ̀májijiji dakwasị obodo a.