ILU
AMAMIHE
Ilu Nenwe
Amamive adụkwa la ngụ a mụrụ ẹ́wọ meru e Jihu dọtịa ya ẹka la ọ́kpá?
Igbo Izugbe
Amamihe anọkwa n’ebe a mụrụ awọ mere e jighi dọtịa ya aka na ụkwụ.
NKỌWA
Mmadụ (ndị mara ihe) anọkwa ya e ji eme nzuzu.
Ọ na-abụ a mụọ nwa ọhụrụ, a dọtịa ya aka aka na ụkwụ. Kaosiladi, aka na ụkwụ awọ sụkọrọ asụkọ maka na o nweghị onye ma ihe nọ n’ebe a mụrụ ya, iji dọtịa ya aka na ụkwụ.