ANỊỌMA: AHAPỤRỤ M PDP MAKA NA GỌVANỌ OBOREVWORI NA OKOWA JỤRỤ ỊKWADO NKEPỤTA STEETI AHỤ



Asaba – Sinetọ Ned Nwoko na-anọchite anya mpaghara Mgbago Ugwu Delta (Anịọma) ekwuwo hoo!haa! na ihe mere ya ji hapụ otu ndọrọndọrọ Peoples Democratic Party (PDP) banye All Progressives Congress (APC) bụ maka na Gọvanọ Steeti Delta, Sheriff Oborevwori na Gọvanọ chịburu steeti ahụ, Ifeanyị Okọwa na-agba nkepụta steeti Anịọma mgba.
N’okwu ọ gwara ndi nta akụkọ n’Asaba, ụbọchị Mọnde, Nwoko kwuru na mbọ ya nile maka nkepụta steeti Anịọma anaghị amịta mkpụrụ maka ọgbaghara na-aga n’ihu n’ime PDP, nke na ha enweghị ike inye atụmatụ nkepụta Steeti Anịọma nkwado zuru oke.
Ọ katọkwara etu Gọvanọ ahụ siri agba ya mgba okpuru na ọrụ dị iche iche ọ chọrọ ịrụrụ ndi mpaghara ahụ.
“Gọvanọ ekweghi m rụọ ọrụ chaa chaa. Ọ kagburu ọrụ anyị kpebiri na-aga arụrụ ndi be anyị, kwuo na ego adịghị dịka Ogige Inye Ọkụ (power plant) Ọkpaị na Éjé (dam) Ọgwashị-Uku. O nyekwaghị ohere iweta onye ọbụla dịka onye òtù board, kọmishọna ma ọ bụ Onyeisioche okpuru ọchịchị.
“A bara m APC bụ òtù ndọrọndọrọ nke Gọọmentị Etiti Ala Naịjiriya iji nwee ike imejupụta nkwa nile m nkwere ndi be anyị”
N’okwu ya, onye inyeaka Gọvanọ Oborevwori, Fred Oghenesivbe, kwuru na Nwoko hapụrụ PDP maka ụjọ na ọ gaghị enweta ikike ịzọ ọkwa sineti n’afọ 2027, n’aha PDP.
hmmm, Igbo nile na-ekele Ned Nwoko maka mbọ eleghị anya n’azụ ọ na-agba maka nkepụta Steeti Anịọma. Kaosiladị, ka anyị leenu ma APC aga akwado Steeti Anịọma bụ nke ọ sị na PDP, ma Gọvanọ Oborevwori, ma Sinetọ Okọwa bụ onye Anịọma, juru ịkwado. Steeti Anịọma nọ n’aka Chineke.