ANWỤCHIKỌWO NWOKE OGUN STEETI JI ỌBARA ASA AHỤ NA MMIRI ALA



Abiokuta: Ndị Uwe ojii ngalaba Ogun Steeti anwụchikọwo ótù nwaamadị dị afọ iri anọ na itoolu, Ganiyu Shina, onye nke e nwetara ka o ji ọbara asa ahụ na mmiri ala na Kotopo dị n’Okpuru Ọchịchị Odeda na steeti ahụ.
Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na steeti ahụ, SP Abimbola Oyeyemi kwuru nke a ụbọchị Tọzdee n’Abiokuta.
“Ndị obodo hụrụ ya ka ọ kwụsịrị ụgbọala mkpata Nissan ya, bịa na mmiri ala ahụ buputa ọbara o bu na mkpọ̀, wepụtakwa ògbó jiri ya sawa ahụ.
“Kaosiladị, ozugbo ọ hụrụ na o nwere ndị na-ekiri ya, o riri mbọ mbọ ọsọ mana a chụwara nwude ya, were kpọzịa ndị Uwe ojii n’ekwentị
“Ka agbara ajụjụ ọnụ, o kwuru na ya nwere nsogbu nke mmụọ mere nwa dibịa jiri gwa ya ka o mee ihe ahụ. Ọ sịkwara na ihe ahụ bụ ọbara ehi, na ọ bụghị ọbara mmadụ.


Oyeyemi kwukwara na Kọmishọna ndị Uwe ojii na steeti ahụ, Lanre Bankole enyela ntụziaka ka e mee nyocha nke ndị ọkachamara iji chọpụta ma ọbara ahụ abụ nke mmadụ ka ọ bụ nke ehi.
Ọ kwuru na Kọmishọna ndị Uwe ojii ahụ kelekwara ndị obodo ahụ etu ha si kpọọ ndị Uwe ojii, n’ejighi aka meminaa ya bụ nwaamad