ANWỤCHIKỌWO ONYE NA-EZUTERE NDI YAHOO NSỤKA OBERE ỤMỤAKA IJI GWỌỌ OKEITE



Nsụka – Anwụchikọwo otu nwata nwoke dị afọ iri abụo na otu, Ifeanyi Omeke, onye na-ezutere ndị Yahoo na Nsụka obere ụmụaka ha ji eme ọ́gwụ̀ ego, ọkacha Okeite.
Ndị nche ógbè jidere ya bụ agabaidu, onye bụ onye Nru, Nsụka ka ọ bịara n’Igogoro, Enugu-Ezie dị n’Okpuru Ọchịchị Mgbago Ugwu Igbo-Eze ka ọ chọrọ ịtọrọ otu obere nwatakịrị nwanyị dị otu afọ na onwa abụọ.
Ka a gbara ya ajụjụọnụ, o kwuru hoo!haa! na nke ahụ bụ nke ugboro iri ọ na-ezuru ụmụaka ndị mmadụ were wegara ndị ọ́gwụ̀ ego Yahoo ha ji agwọ ọ́gwụ̀ ego, ọ kacha Okeite.

Ọ kọwakwara na a na-akwụ ya Otu Narị Puku Naịra maka obere nwa ọbụla ọ tọtara ndị ọ́gwụ̀ ego Yahoo ahụ.
Ndị nche ógbè ahụ nyefezịrị ya n’aka ndị Uweojii ndị na-agba mbọ ijide ndị nile ọ kpọrọ aha aka ha dị na ya bụ arụrụala.
Tufịakwa!