AKỤKỌ ỤWA

ANWUCHIKỌWO ONYE NTỌ̀ BỊARA EKPERE N’ỤLỌ EKPERE ALAKỤBA TARABA

Jalingo – Anwụchikọwo ótù nwata nwoke bụ onye ntọ̀ ka ọ na-ekpe ekpere n’ụlọ ekpere alakụba Izugbe nke Takum dị na Steeti Taraba ụbọchị Fraidee.

Osote ọnụ na-ekwuru ndi Agha ala Naịjiriya, Captain Oni Olubodunde kwuru na ndi agha Naịjiriya nọrọ ụbọchị ahụ jidekwuo mmadụ iri na atọ ndị ọzọ maka arụrụala dị iche iche tinyere ntọ̀rị́.

Oni kwukwara na ndi òtù ha nọkwa n’abalị iri na asatọ ọnwa Ọgọọst were wakpo àkwụ́ ndi ekperime na Takum, ebe ha nọrọ nwụchikọọ ótù onyeisi ndi ntọ, David Musa. Ha sukwara ótù nwaamadị bụ Ibrahim Philemon imi dịka onye na -elekọtara ha égbè ha nakwa ego ha na-enweta.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close