AKỤKỌ ỤWA

ANWỤCHIKỌWO ONYEISI NDỊ OMEKOME KA Ọ BỊARA ỊZỤRỤ Ọ́GWỤ̀ NKELI ÁMỤ̀ IJI DINAA AKWỤLA

Sokoto: Ndị òtù Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC) anwụchikọwo Bello Galaduma, onyeisi ndị omekome dị afọ iri anọ na Sokoto Steeti.

Ozi si n’aka DCC Olusola Odumosu, Ọnụ na-ekwuru ụlọ ọrụ nchekwa NSCDC kọwara na Galaduma so na ndị ha na-achọ achọ kemgbe ihe karịrị afọ abụọ.

Ozi Odumosu wepụtara n’abalị iri abụọ n’asatọ nke ọnwa Julaị afọ a kwuru na nwaamadị ahụ na-ewetara ndị omekome ndị ọzọ ozi banyere ndị ha ga-atọrọ ma na-ebutekwara ha ọ́gwụ̀ tinyere ihe ndị ọzọ ha ji arụ ọrụ.

Ọ bụ ebe ọ gara ịzụrụ ọ́gwụ̀ nkeli ámụ̀ iji ga dinaa akwụla ka aka jiri kpara ya.

Hmm, ihe akwara na – eme ụmụ nwoke!

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close