AKỤKỌ ỤWA
ANWỤCHIKỌWO ỤMỤ NWOKE ISE NDI E JIDERE BU AKPA ABỤỌ JURU N’EGO DỌLA ADỊGBOROJA



Legọs – Majie Adeola Olatunbosun nọrọ ụbọchị Wenezdee were kpebie ka akpọchie ụmụ nwoke ise ndị a nwuchikọrọ bu akpa abụọ juputara n’ego Dọla na Pound adịgboroja nakwa ìgbó.
Ndi ahụ a na- ebo ebubo gụnyere Francis Omwukei, 26; Kingsley Ude, 33; Umar Idris, 37; Eyo, 27 na Bright Ahamefula, 26.
Rita Momoh, onye kpụpụtara ha n’ụlọikpe Majie dị na Yaba, Legọs kwuru na e jidere ha n’abalị itoolu nke ọnwa Ọgọọstụ na White Sand, Ijora, Legọs.

Momoh gwara ụlọikpe Majie ahụ na e jidere ụmụ nwoke ahụ ka ha bu ihe e chere na ọ bụ ìgbó nke gosiri n’ụzọ ọhaneze na-ahụ ya bụ ihe nwere ike ibute nsogbu.
Hmmmm, nsogbu ụwa!