AKỤKỌ ỤWA

ANYỊ CHỌRỌ ISO N’EBUBEAGỤ – NDỊ FULANI NỌ NA GARIKI, LOKPANTA

Gmail icon
facebook sharing button
twitter sharing button
linkedin sharing button
whatsapp sharing button
email sharing button


 Ụmụahịa: Ndi Fulani nọ n’ahịa Gariki, Lọkpanta, Abia Steeti ekwuola na ha chọrọ isonye n’Ebubeagụ.

N’okwu ha gwara ndị nta akụkọ ụbọchị Mọnde, nke ótù onye isi ha bụ Buba Kedemure gụ pụtara kwuru na “asịrị ahụ na efesa ebe nile na ndị ekperime ndị Fulani ndị ESN chụpụrụ n’Ebọnyị Steeti gbalatara ebe a abụghị eziokwu”

Ndị tinyere aka n’ozi ahụ gụnyere Alahaji Annaym Umar; Onyeisi Oche Ahịa Gariki, Ụmụchieze, Hussaini Muhammad, Alahaji Baba Ahmad na Umaru Ali.

Kedemure kwuru na ha edeela akwụkwọ degara ndị Uwe Ojii na ndị DSS na Steeti ahụ, mere e ji zitere ha ndị Uwe Ojii “mobile”.

Ha katọkwara arụ nke ndị Fulani “si mba ọzọ” na-eme ma kwuo na ha chọrọ isonye n’Ebubeagụ iji soro mee ka udo dị.

“Ndi Fulani si mba ọzọ bụ ndị na-ebute ọgbaghara a. Ehi ha dịkwa iche na nke anyị”

facebook sharing button
twitter sharing button
linkedin sharing button
whatsapp sharing button
Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close