Uncategorized
ÀNYỊ̀M ATLANTIC ERIWO NWATAKỊRỊ NWOKE DỊ AFỌ IRI NA ATỌ N’ÓSÉ ALATISE, LEGỌS

Legọs- Mmiri eriwo, Kelvin Onyengba, nwatakịrị nwoke dị afọ iri na atọ, oge ya ndi enyi ya ise gara igwu mmírí ànyị̀m Atlantic n’ósé Alatise dị n’Ajah, Legọs.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ya bụ njinji jiri n’ebe elekere iri na abụọ nke ehihie ụbọchị Tuuzdee, abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Febrụwarị afọ a.


Ozi si n’aka ndi Uweojii na-ekwu na ebili mmiri bùrù ya bụ nwatakịrị nwoke ka ọ na-egwu mmiri.
Ọnụ na-ekwuru ndi Uweojii na steeti ahụ, David Hundeyin kwuru na ndị ọrụ ha agawo n’ebe ihe ahụ nọrọ mee mana na a ka na-eche ka ànyị̀m ahụ tụpụta ózú ya.
Chai! “Onye ajọ chi mmiri na-àfá n’ézé”. Kedu ka o si bụrụ ya ka ebili mmiri bùrù? Ka mkpụrụ obi ya zuru ike na ndokwa. Iseeeeeee!