ANYỊM, CHAA N’ỤZỌ, ANYỊ SO ỤMAHỊ, ONYE MERE ANYỊ IHE I MENWUGHI ABA APC – NDỊ IVO


Abakiliki: Ndisonwere Okpuru Ọchịchị Ivo dị n’Ebọnyị Steeti agwala nwa ha nwoke, Ichie Anyịm Payọsụ Anyịm, onye bụbu Onyeisi Ụlọ Nzukọ Sineti Naịjiriya ka ọ chaara ha n’ụzọ maka na ha so Omenka Devidi Nweze Ụmahị, Gọvanọ Ebọnyị Steeti aba ótù ndọrọndọrọ ọchịchị APC.
Nke a sitere n’ozi ha wepụtara n’ọgbakọ ukwu ha nwere ụbọchị Wenezdee n’ogige Women Development Centre, Abakiliki.
“Nwa anyị nwoke a (Anyịm) enweghị ihe ọ rụrụ anyị ma fọdụzịa ndị akụkụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda ndị ọzọ, n’ogologo oge ọ nọrọ n’ọchịchị dịka Onyeisi Sineti Naịjiriya nakwa Odeakwụkwọ Na nke Gọọmenti Etiti Naịjiriya.
“Sọọsọ ihe o wetara anyị bụ nsogbu na ọgbaghara”.
Ha gakwara n’ihu kelee Gọvanọ Ụmahị, onye nke ndị eze Ọdịnala ha chiri Ebube Dike Ivo, maka ọrụ dị iche iche ọ rụrụ ha nakwa ndị o ji n’aka dịka Ụzọ awara awara kọnkịrị Akaeze – Okue- Ishiagụ, Ógwè Mmiri Okue, Ụzọ awara awara Kọnkịrị Akaeze – Uburu, Atụmatụ Mmiri Ọṅụṅụ Ivo, wdg.
Ndị tinyere aka n’ozi ahụ bụ mmadụ iri anọ, ndisonwere Okpuru Ọchịchị Ivo. Ụfọdụ n’ime gụnyere Hon Onyebuchi Ọgbadụ, Onyeisi Oche Okpuru Ọchịchị Ivo, Ichie Uchenna Ọjị, Kọmishọna Ebọnyị Steeti na-ahụ maka Mgbasa Ozi na Hon Ray Akanwa, onye bụbu Onye nnọchiteanya Mpaghara Ivo n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Ebọnyị Steeti
Ndị ọzọ bụ Mazị Aleksị Chukwu, Onyeisi Izugbe (PG), Nzukọ Obodo ndị Akaeze na Ichie Stanli Anyịm, Onye Ichie n’obodo Ishiagụ.