Uncategorized
ARA AGBAALA AKWỤLA ABỤỌ N’OWERE, ỤJỌ JIZI NDI ỌZỌ


Owere: Ka a gbara ekeresimesi na afọ ọhụrụ, ụmụ akwụla abụọ n’Owere, Imo Steeti na- ágbázị́ árá.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-egosi na ụmụ agbọghọ abụọ bụ ndị “oji úkwù àkpá ego” gbawara árá ka ụmụ nwoke, ndị Yahoo na ndị ọ́gwụ̀ ego dinachara ha.
Árá bidoro ótù n’ime ha bụ nwata akwụkwọ mahadum IMSU na Njekọrịta Ụzọ IMSU ebe árá pụrụ ọkụ elu nke ọzọ na Njekọrịta Ụzọ Cherubim.
Ọ bụ n’ótù ụbọchị, abalị isii ọnwa Jenụwarị ka árá pụrụ ha abụọ.
Kemgbe ahụ, ụjọ jizi ndị akwụla Owere mere na ọtụtụ n’ime ha kwalazịrị maka ize ndụ.