AKỤKỌ ỤWA

ARỤ! NWAANYỊ NA DI ADA YA NWAANYỊ AGBAWO AKWỤKWỌ

Arụ na-emezi n’ụwa! Oriakụ Fundi Lesetedi anarawo ada ya nwanyị ụra rahụ site na ịpụnahụ ya di ya, ha abụọ were mee agbamakwụkwọ.

Agadi -ekwe-nka ahụ dị afọ iri ise na abụọ siri be di ya na Johannesburg gaa mpaghara Kwazulu Natal, ịga nye aka lekọta Sisifo, di afọ iri abụọ na abụọ, onye bụ di ada ya nwanyị, Ntubeko, onye dị afọ iri na itoolu, oge ya bụ nwaamadị nọ n’ọrịa.

Kaosiladị, o sizi ‘nkute ụtaba, baa ime ahịa’. Ya bụ agadi nwaanyị na di nwa ya nwaanyị malitete inwe mmekọrịta. N’ihi ya, oge nwaanyị laghachiri be di ya, ka di ada ya gbakere n’ọrịa, kama ịkwụsị akwụsị, ụtọ lazịrị elu nke bụ na ha abụọ na-anọ ogologo oge ime mkparịta ụka n’ekwentị.

N’ihi na ọrụ di ya n’ụlọ mmepụta ngwa ahịa mere ka ọ ghara ịna enwecha, ajọ nwaanyị nwere ohere ya na di ada ya nwaanyị ịna epiogharị, enwe mmekọahụ.

Oge di ya chọpụtara, ọ chụpụrụ ya n’ụlọ. Kaosiladị, ọ kwara lakwuru ada ya nwaanyị na di ya.

Mmekọ ha abụọ butere ọgbaghara nke na Ntubeko kpọrọ nwa ha nwoke dị otu afọ, pụọ hapụrụ nne ya na di ya ụlọ.

Nne iberibe ahụ na ọgọ ya nwoke gara mee agbamakwụkwọ n’ụlọikpe ụbọchị Valentine afọ a.

Tụfịakwa! ‘Okeke nwaanyị dị ntị njọ”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close