AKỤKỌ ỤWA

ARỤ! NWOKE KWÀRÀ NWA BOY YA ACID, KPỌCHIE YA N’IME ỤLỌ ỌNWA ATỌ MAKA NGWA AHỊA NA-EFU EFU

Legọs: Aka ndị Uwe Ojii akparala ótù nwaamadị, Onye Oji ego achụ ego bụ Ichie Anayo, Onyenwe Ụlọ ọrụ Ayocity Surgicals, Legọs maka ịkwa “nwa boy” ya bụ Ifeanyi “acid” ma kpọchido ya n’ime ụlọ ọnwa atọ maka ngwa ahịa ya na-efu efu.

Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na nwoke ahụ chọpụtara na ngwa ngwa ahịa ya na-efu efu n’ọnwa Novemba afọ gara aga. Ụmụ boy ya ndị okenye gbalagachara.

Nwoke ahụ jideziri Ifeanyi, onye dị afọ iri n’asaa bụrụkwa onye ka nọworo sọọsọ ọnwa ise n’aka ya, tichara ya ihe were kwaa ya acid, ma n’isi ma n’azụ. Ọ kpọchidoro ya n’ime ụlọ n’ekweghị akpọga ya ụlọ ọgwụ.

Nwatakịrị ahụ nọchara ọnwa atọ n’ime ụlọ tupu ọ gbapụ na be nna ya ukwu ahụ na Lekki mere ndị mmadụ jiri kpọgara ya ndị Uwe Ojii.

Kaọdịtaa, acid ahụ atarichaala nwatakịrị ahụ ahụ nke na a ga-áwá ya ahụ n’ụlọ ọgwụ, iji zọọ ya ndụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close