ASỊRỊ AJỌKA! NWANYỊ BU ỤGBỌALA EFE ỌSỌ ỊGA JIDE DI YA A SỊ BU ASA ANWỤỌLA NA MBEREDE OKPORO ỤZỌ


Asịrị ajọka! Ótù nwata nwanyị anwụnyụọla anya ebe o ji iwe na ọnụma, jiri ọsọ na-efe n’ụgbọala ya ịga “jide” di ya, onye a sịrị bu asa n’ụgbọala ya.
Ya bụ nwanyị onye mba Gana gbapụrụ ọhịa gaa sugwọọ onwe ya. Ọ dịghịzi were chọpụta ma “asa” ndị asịrị gbakaa ute sị na di ya bu, abụ onye ọrụ ya, nwanne ya ma ọ bụkwanụ onye nwunye na onwe ya mara nke ọma.
Mabel Aku Banesseh, onye nta akụkọ na mba ahụ, onye kwusara nyere ụmụ nwanyị ndụmọdụ sị,
“Ótù nwata nwanyị nwụrụ n’okporo ụzọ awara awara ebe o si Accra agbaje Tema, ịga jide di ya onye a sịrị bu nwanyị ọzọ n’ụgbọala ya. O ruteghizi na ndụ iji chọpụta ma ọ bụ onye ọrụ di ya, nwanne ya nwanyị, ma ọ bụ dị enyi ya nkịtị onye ya onwe ya mara. Ekwela ka asịrị taa isi gị.
E legharala ihe ka mkpa anya. Gị onwe gị bụ NWANYỊ ka mkpa. Leta onwe gị anya. “



