AKỤKỌ ỤWA

ASỌMMPI AGBỌMMA ADA 042:NWAADA NNAMANI ETURUWO UGO

Nwaada Esta Nnamani eturuwo ugo dịka Ada 042 na Mmemme Asọmmpi Agbọmma Ada 042 nke mbụ ya e mere ụnyahụ n’ogige Oaklands, Enugwu.

Nwaada Nnamani, onye nnọchitere anya Okpuru Ọchịchị Ọdịda Anyanwụ Nkanụ na ya bụ asọmmpi ji anya mmiri ọṅụ were kwupụta obi ụtọ ya.

“E kelere m Chineke maka okpueze Ada 042 nke a m nwetara. A tụghị m anya ya”

Nwaada Chioma Nwabueze (Ezeagụ) gbara onye nke abụọ ebe Nwaada Ugwu Lọvliin(Nsụka) gbara onye nke atọ. Okpuru Ọchịchị Iri n’asaa dị n’Enugwu Steeti nwere ndị nọchiri anya ha n’asọmmpi ahụ.

Na mpụta mbụ, ndị Agbọmma ahụ pụtara n’ọ́gbọ̀, ha yi uwe “trouser jeans” na-acha anụnụ anụnụ (blue) na Polo ọcha n’elu ya. Ndị mmadụ tụrụ anya na ha kaara ike sọọsọ ekike Ndigbo.
Na mpụta nke abụọ, ha gbara Egwu Ịdịnotu (Unity Dance) ebe ha nile gbara egwu ndị be ha ma zakwaa ajụjụ ole n’ole.

Onye nọchiri anya Aka na-achị Enugwu Steeti bụ Kọmishọna na-ahụ maka Omenala na Njem Nkiri anya Mazi Ugonna Ibe bunyere ndị chịkọbara Mmemme ahụ ụ́kpà ekele maka mbọ ha na-agba ịkwalite omenala Igbo.

Mazi Ibe buru ụzọ kpaa ndị mmadụ ọchị
“Ihe unu ejighị kụọrọ m aka, ọ maka na isi m n’afọ m aghaghị ka nke ndị Kọmishọna ụfọdụ?”

“A na m ekele Gọvanọ anyị, Rt. Hon Ifeanyi Ugwuanyi, onye mere ka udo pụrụ iche dị n’Enugwu Steeti mere e ji nwee ike inwe mmemme a taa.”

O kelekwara ndị chịkọbara mmemme ahụ, ọ kacha Ichie Chukwuma Ifrem Okenwa, onye a makwara dịka CEO, onye nwe ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị Queens Comprehensive Secondary School, Enugwu nakwa Ichie Odeiga Jideọnwọ, onye nwe ogige Oaklands, ebe a nọ mee mmemme ahụ, nke o nyere n’efu.

Ọ rịọkwara ka ndị Ọkaikpe Asọmmpi ahụ hụ na e nweghị wuru wuru. O kwukwara na Mịnịstrị ya ga-eme ka Mmemme ahụ na-adịzị kwa afọ.


N’okwu nke ya, Onye Olebia Mmemme ahụ, Dọkịnta Chukwuma Ifrem Okenwa kwere nkwa na aghụghọ ọbụla agaghị adị n’asọmmpi ahụ.


“Onye ga-eturu ugo n’abalị a ga-abụ onye kwesịrị ekwesị. Ihe nile ga-aga n’usoro ya. Ndị bụ ndị Ọkaikpe Asọmmpi a bụ ndị nwere ezigbo aha.”

Oge ndị Ọkaikpe Asọmmpi na-ajụ ha ajụjụ, ụfọdụ ndị Agbọmma ahụ kwuru ihe tọrọ ọchị


Nwaada Ụbọsị (Mgbago Ugwu Enugwu) kwuru na “ndị be anyị (Ogwuiyi Nike) ji ala eme ọjị”.
Nwaada Chiọma Nwabueze (Ezeagụ) kwuru sị” Ihe e ji mara ndị be anyị bụ Abacha, ị taa Abacha m gwọrọ, ị lụwa m”
Nwaada Precious Ogbonna(Aninri) kwuru sị “Ihe e ji mara Aninri bụ anụ jaki nakwa ịkọ nri”


Mazi Remigus Ọnaga hụzịrị maka mmemme Ịwa Ji nke ndị Oakland mekwara n’abalị ahụ.
N’ikpeazụ, ndị Ọkaikpe Asọmmpi jụrụ ndị Agbọmma ahụ nile ihe ha ga-eme iji kwalite omenala na asụsụ Igbo ma ha turu ugo.

Obi dị ndị mmadụ ụtọ maka ya bụ mmemme nke gara nke ọma.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close