ASỌMMPI BỌ́Ọ́LỤ̀ ỤMỤNWANYỊ MBAỤWA 2023: FIFA AMACHIELA JEMISI NWA ỊNGLANDỊ MAKA Ị́ZỌ̀ ALỌZIE KA APỊTỊ



Òtù Egwuregwu Bọ̀ọ̀lụ̀ Mbaụwa bụ FIFA amachiela Lauren Jemisi nke mba Ịnglandị isonyekwa n’asọmmpi ọbụla n’ime Asọmmpi Bọọlụ Ụmụnwanyị Mbaụwa na-aga n’ihu ugbua na mba Ọ̀streliya na Niu Zilandị.
Ya bụ nwanyị na-agbara mba Ịnglandị ihu nwetara akwụkwọ nchụpụ (Red Card) na nkeji iri asaa n’ime asọmmpi égbé buru ọ laa dị n’etiti ha na ndị “Super Falcons” nke ala anyị Naijiriya.
Na eme nta, eme ìmó, oge ha abụọ kụkọtara wee daa, Jemisi biliri makwasị Alọzie, onye ka tọgbọ n’ala, were zọọ ya ka apịtị.

FIFA hụtara ajọ akparamagwa Jemisi a dika nke megidere Atụmatụ Egwuregwu Ziri Ezi (Fair Play Principle). Egwuregwu bụ egwuregwu, ọ bụghị agha ma ọ bụ tigbuo zọgbuo.
Chai! Nwa-ada Jemisi, afọ tara gị mmiri. A hapụ gị, I were ụkwụ zọjie nwanyị ibe gi úkwù ọ ga-eji mụ nwa. Alọzie, nwanyị ọma, gba ya nkịtị lọtawazie, agbapụlanụ unu