AKỤKỌ ỤWA

ATIKU NỌ NA NSOGBU:ỤLỌIKPE ABỤJA ETIELA IWU KA E JIDE YA

Abụja: Ụlọikpe nọ na Kubwa, Abụja nọrọ taa tie iwu ka e jide Alhaji Atiku Abubakar, nwa Onye bụbu Osote Onyeisiala Naịjiriya

Ọkaikpe Bashir Danmaisule, tiri iwu ahụ maka na nwaamadị ahụ nupụrụ isi na mkpebi ụlọikpe ahụ nke gwara ya ka o nyefee ụmụ ya nwoke atọ n’aka nne ha, nwunye ya hà abụọ gbara onwe ha alụkwaghịm, Maryam Sherif.

Ụlọikpe ahụ nọrọ na mkpebi ya, n’abalị iri abụọ n’asaa nke ọnwa Ọktoba afọ a, were gwa Abubakar ka ọ kpọnye Maryam ụmụaka ahụ.

Ma nwaamadị ahụ ma Ọkaiwu ya, Abdullahi Hassan enweghị onye bịara ụlọikpe ụbọchị ahụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close