ATM KAADỊ DỊ 2, 886: EFCC JIZI ONYE NJEM BU YA AGA DUBAI

Legọs : Mazị Ishaq Abubakar, onye njem na – aga Dubai ka ndị ọrụ Kọstọm jidere ma nyefee n’aka ndị EFCC n’Ọdụ Ụgbọelu Mbaụwa Murtala Mohammed, Legọs maka ibukọju ATM kaadị dị 2,886 nakwa SIM kaadị anọ o zoro n’ime ígbè Indomie.
N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụnyaahụ, oge ọ na-enyefe nwoke ahụ n’aka ndị EFCC, Abdulmumin Bako, onye ji ọkwa Deputy Controller, n’ụlọ ọrụ Kọstọm kwuru na ndị otu ha anya na-aghọ nkọ jidere ya n’ụlọ ezumezu ọpụpụ (Departure Hall) nke ọdụ ụgbọelu ahụ.
“Ndi ọrụ anyị nwuchikọrọ Ishaq Abubakar, onye akara Ejirimara Mbaụwa (International Passport) ya bụ A08333717 n’abalị iri abụọ n’abụọ nke ọnwa Ọgọọst afọ a.”
Onyeisi ụlọ ọrụ EFCC, Mpaghara Legọs, AbdulRasheed Bawa, ka ọ na-akpọrọ onye ahụ a na enyo enyo, kọwara na ATM kaadị ndị ahụ bụ nke e ji atụ akwụkwọ
O kwekwara nkwa na EFCC ga-anwuchikọ ndị nile aka dị na ya