NKE NA-EME UGBUA

ATỌRỌWO EMỊYA NA KADUNA

Kaduna: Ndị ekperime atọrọwo Emịya Kajuru, Kaduna Steeti Alahaji Alhassan Adamu na mmadụ iri ndị ọzọ gụnyere ụfọdụ ndị ezinụlọ ya n’ebe el iri n’abụọ nke isi ụtụtụ taa bụ ụbọchị ụka.

N’okwu ya, Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na steeti ahụ, Muhammed Jalige kwuru sị, “Ndị Uwe Ojii amalitewo ịchọgharị ndị ekperime ahụ iji napụta Emịya ahụ na ndị ọzọ ha tọọrọ”

Ozi hoo!haa!! nwetara na – ekwu na Emịya ahụ kpọrọ ọgbakọ nchekwa ụnyaahụ ya, oge ọ nụrụ kepu kepu na a chọrọ ịtọrọ ya mana o nweghị ihe ndị ọrụ nchekwa obodo mere chaa chaa.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close