ATỤMATỤ “ZONING” :UGWUANYI ỊZỌ ỌKWA SINETI BỤ AGHỤGHỌ – AMB. EZE, ONYE NA-AZỌ SINETI N’AHA APC




Nsụka: Onye Nnọchiteanya, “Ambassador” Ejike Eze, onye ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress, APC azọ ọkwa Sineti na Mpaghara Mgbago Úgwú Enugwu ekwuwo hoo!haa! na Gọvanọ Ifeanyichukwu Ugwuanyi nke Enugwu Steeti ịzọ ọkwa Sineti nke mpaghara ahụ bụ aghụghọ.
Eze kwuru nke a ụbọchị Fraịdee oge ọ nọrọ na Nsụka, isi obodo mpaghara ahụ were gwa ndị nta akụkọ okwu.
“Mpaghara Sineti Mgbago Úgwú Enugwu nwere nkeji Ụlọ Omebeiwu Etiti atọ gụnyere Mgbago Úgwú Igbo-Eze/Udenu, Igbo-Etiti/Ụzọ-Ụwanị na Nsụka/Ndịda Igbo-Eze.
“N’ime nkeji Ụlọ Omebeiwu Etiti atọ a, Sinetọ Chika Ụtazị na-apụ apụ si Igbo-Etiti/Ụzọ-Ụwanị, onye ọ nọchiri bụ Sinetọ Ayọgụ Eze si Mgbago Úgwú Igbo-Eze/Udenu, bụkwa ebe Gọvanọ Ugwuanyi si.
“N’ihi ya, ndị o ruru ịga Sineti bụ ndị Nsụka/Ndịda Igbo-Eze. A bịa n’ime nkeji Ụlọ Omebeiwu Etiti Nsụka/Ndịda Igbo-Eze, ndị o ruru bụ ndị agabeghi mbụ bụ ndị be anyị, ndị Okpuru Ọchịchị Ndịda Igbo-Eze maka na Sinetọ Fidelisi Okoro, si Okpuru Ọchịchị Nsụka ebuwo ụzọ gaa Sineti n’afọ 1999.”
O kwukwara na ọ jọgburu udele, sigbuo nkakwụ ma bụrụkwa aghụghọ nakwa ikpudo eziokwu ihu n’ala bụ Ugwuanyi ịzọ Sineti, ebe ọ bụghị òkè ndị nkeji Omebeiwu Etiti ya site n’atụmatụ “Zoning” bụ atụmatụ mbugharị ọchịchị.
Nwoke a, onye bụ ochie dike laworo ezumike nka n’ọrụ nnọchiteanya kwara arịrị maka etu òtù ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party, PDP, siri were jichie ọchịchị n’Enugwu Steeti n’ụdị megidere ezi ọchịchị kemgbe afọ 1999.
Nwoke a bụ onye Ibagwa-Aka dị n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Igbo-Eze kwekwara nkwa ịhụ na e mere onye Nsụka Onyeisi Mahadum Naịjiriya, Nsụka.
“Ọzọkwa, Ugwuanyi kwesịrị inye Chineke otito maka amara ya n’isi ya. Ọ nọrọla n’ọkwa ọchịchị afọ iri abụọ, afọ iri na abụọ dịka Onye Omebeiwu Etiti tinyere afọ asatọ dịka Gọvanọ.”
Hmmm, o setigo!