Uncategorized

ATỤỌLA NWATAKỊRỊ AFỌ IRI N’ABỤỌ NGA AFỌ ASAA MAKA ỊGBA NWA DỊ ÓTÙ AFỌ EGBE

Ụlọikpe na Texas, mba Amerịka atụwo Lili Rodneyy, nwatakịrị dị afọ iri n’abụọ na-agụ egwu ndị agboro (rapper) nga afọ asaa maka ịgba nwa dị ótù afọ égbè nakwa mgbaaka onyonyo nchekwa (ankle monitor) ya.

N’agbanyeghị ibe ákwá na arịrịọ nke nwatakịrị ahụ si na nwata kpawa arụ, Ọkaikpe Kim nọrọ n’ikpe ahụ e kpere n’ọba ozi mmekọrịta Zoom were ziga ya na nga ụmụaka (juvenile detention Centre).

Ọkaikpe ahụ gwara ya sị, “Aṅụrị mmemme Ịgba afọ. Ugbua, ị dịzị afọ iri n’abụọ. Ọ dị mwute na ị ga-eme mmemme a n’ụlọ nga.

“E nyere gị oge amara site afọ gara aga maka imebi ihe Gọọmenti. Ị rịọrọ mgbaghara ma kwekwaa nkwa ịgba ndụ gị. A tọhapụrụ m gị maka na ị kabụ nwatakịrị.

“Oge ọbụla e mere ebere hapụ gị, i bepụ mgbaaka onyonyo nchekwa gị ga kpakwaa arụ ọzọ.

“Nke ugbu a, i betaghi ya n’akwa. Ị ga-anọ afọ asaa na nga”.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close