AKỤKỌ ỤWA

ATỤỌLA NWOKE JI BISKIITI RATA MA DINAA NWA AFỌ ITOOLU NGA

Sokoto: Ụlọikpe nọ na Sokoto atụọla ótù nwoke, Aminu Ibrahim, onye ji biskiiti were rata ma dinaa nwatakịrị dị afọ itoolu nga afọ anọ.

Ọkaikpe Muhammad Muhammed nọrọ n’abalị iri abụọ n’asatọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021 were bie ikpe ahụ nke ụlọ ọrụ National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons (NAPTIP) n’ihu ya.

Ekperime ahụ jiri biskiiti na ego were nwatakịrị ahụ bụ nwa onye agbata obi ya iji were dinaa ya n’ike.

Arụ na-emekwa!

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close