AKỤKỌ ỤWA
ATỤỌLA ODIBO NGA MAKA INYE ỤMỤAKA Ọ NA-ELETA MAMỊRỊ NA “FEEDING BOTTLE”


Ụlọikpe Majie atụọla Vicky Abiria, onye dị afọ iri atọ n’asatọ nga afọ anọ na ọnwa isii na Namugongo, Kira dị na Mpaghara Wakiso na Uganda maka iji ekpem erimeri ụmụaka “feeding bottle” were nye ụmụ ejima ọ na-eketa n’erubeghi afọ abụọ mamịrị ya.
Majie Joan Achiro kwuru na nke bụ maka na ọ rịọrọ mgbaghara.
Nna ụmụaka ahụ, Mazị Chica kọwara na o tetara n’isi ụtụtụ abalị asatọ nke ọnwa Nọvemba were hụ ihe na-acha edo edo na “feeding bottle” ụmụaka ahụ.
Nnyocha ndị Ụlọ ọgwụ gosiri na ótù n’ime ụmụaka ahụ esila na ya bute ọrịa syphillis.