AKỤKỌ ỤWA

ATỤWO DIBỊA OYIBO MBAITOLI NGA AFỌ ABỤỌ MAKA IZU OHI

Uyo – Ụlọikpe Akwa Ịbọm Steeti dị n’Eket atụwo ótù dibịa oyibo, Nwaopara Adolphus Uche nga afọ abụọ maka izu àkwà dị n’ụlọ ọ́gwụ̀ Ukwu Immanuel General Hospital, Eket nakwa Immanuel Psychiatric Hospital, Eket ma buga ha n’ụlọ ọ́gwụ̀ nke ya onwe ya.

Nwaamadị ahụ dị iri afọ atọ na itoolu mere ya bụ mpụ oge ọ nọ n’ọkwa dika onye nlekọta ụlọ ọgwụ ndị nwere ọrịa isi, Immanuel Psychiatric Hospital.

Ọkaikpe Nsemeke Daniel mara Dọkịnta Uche, onye bụ onye Mbiere nke dị n’Okpuru Ọchịchị Mbaitoli, Imo Steeti ikpe maka ebubo abụọ, gụnyere izu ohi na ịkpa nkata izu ohi, were tụọ ya nga afọ abụọ.

Tufịakwa! Kedu ka dibịa oyibo ga-esi bụrụ izu ohi àkwà ndi ọrịa na-edina n’ụlọ ọ́gwụ̀ ka ya mma. Nkea bụzị nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close