ATỤWO ONYENWE ỤLỌ AKWỤKWỌ NA BINI NGA ỌNWA ISII MAKA ỊKPỌ NNE NWATA AKWỤKWỌ YA AKWỤLA

Bini – Mazị Paul Okugbowa, Onyenwe ụlọ akwụkwọ Calvary Crown Academy Bini, Steeti Edo agaala nga ọnwa isii maka ịkpọ otu nwaanyị ụmụ ya na-agụ ebe ahụ akwụla n’ihu ọhanaeze
Majie Caroline Oghuma nọrọ na mkpebi ya were tụọ ndi nkuzi atọ nga oge dị iche iche maka nleghara anya n’ọrụ ha.
E kpere mmadụ anọ ahụ ikpe site na nkeji 167(2), 412, 270, 412, na 267 nke iwu megidere arụrụala nke Edo 2022.
Kaosiladi, Majie Oghuma nyere Okugbowa ohere ịkwụ nha N100,000 karịa ịga nga.
Ndi nkuzi atọ -Blessing Osarodion, Egharevba Esosa na Isioma Nimen nwetara amamikpe maka nleghara anya ụmụaka ha na elekọta.
A tụkwara Osarodion na Esosa nga otu afọ ma ọ bụ ịkwụ nha N100,000 , maka nleghara anya n’ọrụ nke butere mmerụ ahụ nwata akwụkwọ ha bụ Salma Aigbudu.
Okwu a butere ije nga Okugbowa bụ nke mere n’abalị asatọ ọnwa Septemba, afọ 2023, n’isi ụlọ ọrụ ndi uweojii mpaghara Zone 5 na Bini.