Enugwu –  Ụfọdụ ndị bi n’Enugwu ekwuola ka Gọọmenti Steeti ahụ mechie ụlọ egwu awantịlọ nile nọ n’Enugwu dịka Xtreme, 2nite, Cynosure, Cubana, wdg iji belata nkesa ajọ ọrịa a na-anyụ ụwa dum anya ugbua a na-akpọ ọrịa koro. Otu onye hoo!haa!! gbara ajụjụ ọnụ, Mazị Nnamdi Mbadiwe kwuru naRead More →

Abụja – Alahaji Atiku Abubakar, onye jibu ọkwa dịka Osote Onyeisiala ma bụrụkwa Onye ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP were zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjiriya na nhọpụta gara aga ekwuola na ọkpara ya ebutewo ọrịa a na-anyụ ụwa anya ugbua a na-akpọ ọrịa koro. N’ozi ya n’ọba ozi mmekọrịta Twitter,Read More →

Legọs –  Oke ọdachi dakwasịrị ndị otu egwu bọl Rangers International, Enugwu nakwa ndị nkwado ha nile n’ụtụtụ taa oge ndị egwu bọl ha mmadụ atọ nwere ihe mberede okporo ụzọ. Ifeanyi George, onye na-agbara Rangers ihu nwụnyụrụ anya ebe a na-azọ ndụ mmadụ abụọ so ya n’ụgbọala, tinyere IbrahimRead More →

Ọnịcha – Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ ka anyị nụrụ chọrọ igbu onwe ya ka ọ chọpụtara na enyi ya nwoke, ọ tụkwasịrị obi bụ nwoke ji nwanyị, chịkwa ụmụ. Nwa agbọghọ a, Oluchi Akabilo onye Obosi dị n’okpuru ọchịchị Mgbago Ugwu Idemili nke Anambara Steeti jiri iweRead More →

– E Sila Ụlọ Ọgwụ Colliery bụga Ogige ahụ n’ụlọ Ọgwụ ESUTH, Parklane.  Enugwu – Gọọmenti Enugwu Steeti esila n’ụlọ ọgwụ Colliery buga Ogige Nkewapụ Ọrịa Koro n’ụlọ ọgwụ ESUTH /Parklane  Enugwu. Kọmishọna Steeti ahụ na-ahụ maka Ahụike, Dọkịnta Agụjiobi kwupụtara nke a n’ozi o wepụtara ndị nta akụkọ ụnyaahụ.Read More →

Legọs – Ụlọ ọrụ Federal Competition and Consumer Protection Commission (FCCPC) ụlọ erimeri ndị Chaịna dị na Victoria Island, Legọs maka ịjụ ịnabata ndị Naịjiriya ebe ahụ. N’ozi ya na Twitter, ụlọ ọrụ FCCPC kọwara na ndị na-arụ n’ụlọ erimeri  “Haufei Restaurant and Mall” , nke dị na 33 AboyadeRead More →

Abụja – Ụfọdụ ndị bụ ihere eme. Tonto Dike, omebe ejije Nollywood okwu n’ụka na-adị mma n’ahụ emekwaala ọzọ. Nwa ya nwoke dị afọ anọ, Andre Ọmọdayọ Churchill kparịrị ka o yi “ákwá gbọ ọtọ” gaa ileta ya n’ụlọ akwụkwọ ọtakara ya. Tonto jiri aka kọọ ihe merenụ n’ọba oziRead More →

Inwe nkwenye onwe dị oke mkpa maka mmadụ inwe agamnihu na ndụ ya- Ọkammụta Chidobem Enugwu – Ndi gụrụ n’Ụlọ akwụkwọ College of the Immaculate Conception, (CIC), Enugwu nọrọ ụnyahụ bụ Wenezdee were chịkọba ọzụzụ maka ụmụ akwụkwọ ndị nke na-apụzi apụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Ọkammụta Ikechukwu Chidobem, onye jibuRead More →

Maịk Tyson, nwa-afọ mba Amerịka bụbu ọkaibe n’iti ọkpọ ekwuola hoo!haa!! na nwoke ọbụla ga-alụ ada ya nwanyị ga-enweta nde dọla iri n’aka ya. Tyson bụ onye kpara ike dị egwu oge ọ ka na-eti ọkpọ mere e ji kpọwa ya “the Baddest man”. Kaosiladi, ka o si bụrụ naRead More →

Ọ nwụrụ maka na ndị ụlọ ọgwụ na-eche akwụkwọ ikike ndị Uwe Ojii Asaba :Otu dinta dị iri afọ atọ n’asatọ, Mazị Ubaka Nwammọ anwụọla n’Ọgwashị Uku, Delta Steeti ụbọchị Mọnde oge mgbọ pụrụ n’egbe ya n’amaghị ama tụrụ ya. Nwanne ya, Toni Isichei sịrị na ọ nọ n’ụlọ ọgwụRead More →

Enugwu – Ụlọ ụka Assemblies of God achụọla Onye Nlekọta Ukwu ha, Ụkọchukwu Dọkịnta Chịdị Okoroafọ maka akwamiko. A chụpụrụ Okoroafọ dịka ụkọchukwu maka mmekọrịta n’ezighi ezi dị n’etiti ya na otu nwanyị bi na mba Amerịka, Oriakụ Maurrissal Nwosu. Otu nnyocha lebara anya n’okwu ahụ nke Ụkọchukwu Aịzik MpamugoRead More →

Abakaliki – Ndi nchị ehi ndị Fụlani nọrọ ụnyahụ were wakpo ma sụọ obodo nta Ndiagu orie dị n’Ụmụogudu Akpụ nọ n’ọnụmara Ngbo nke dị n’Okpuru Ọchịchị Ọhaukwu n’Ebọnyị Steeti akwụ. Ndị obodo ahụ na-ebokwa ndị soja Naịjiriya ebubo na aka ha dị na mwakpo a nọrọ bọọ ndị beRead More →

Enugwu – Otu Igbo Renaissance Forum (IRF) akọwaala atụmatụ ịrụ ọdụ ụgbọelu n’Ụmụeri dị n’Okpuru Ọchịchị Ọwụwa Anyanwụ Anambara nke Gọọmenti Anambara Steeti bagidere dịka ụzọ e ji  anapụ ndị Steeti ahụ ego. Nze Ugo-Akpe Ọnwụka, Onye Nlekọta Ukwu otu a kwuru nke a n’ozi o wepụtara ndị nta akụkọRead More →

Legọs – Gọọmenti Legọs Steeti ekwuola na ha na-achọ mmadụ abụọ dị ka ha ebu ọrịa Coronavirus achọ. Kọmishọna na-ahụ maka Ahụike na Steeti ahụ, Ọkammụta Akin Abayomi kọwara na mmadụ abụọ ahụ bụ Enwelunta Obumnore Godfrey na Salami Abiodun Sadeeq. Ọ kọwara na mmadụ abụọ ahụ bụ ndị haRead More →

Ibadan – Ụgbọala obu mmanụ (petrol tanker) nọrọ ụnyahụ n’okporo ụzọ awara awara dị n’Alakịa, Ibadan were kụgbuo mmọnwụ. Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na mmọnwụ ahụ hapụrụ akụkụ ụzọ gbara egwu pụta n’etiti okporo ụzọ. Kaosiladi, o chefuziri na “Ka e ji ọkụ asọrọ nsị egbe bụ ka e jiRead More →