Abụja: Nsogbu Ọkaikpe Ukwu Naịjiriya, Muhammad Tanko dịkwa ka ọ karịrị akarị. A ka na-ekwu na ọ wuru onwe ya n’ala n’ajụjụ nnyocha ndị Sineti gbara ya, ọ na-akọzi na akịka tara asambodo ụlọ akwụkwọ praịmarị ya. Tanko kwupụtara nkea n’ime iyi ụlọikpe ọ ñụrụ n’Ụlọikpe Mkpegharị dị na Jọs,Read More →

Legọs: Egwu dị n’uhuruchi ụnyahụ bụ Sọnde, abalị iri abụọ nke ọnwa Julayị n’asọmmpi itiọkpọ GOTV agba nke iri n’itolu oge otiọkpọ mba Hana bụ Edem “Lion Heart” Biki koropuru ka Rilwanu “Baby Face” Babatunde, ọkaibe Naịjiriya tituru ya. Nwa-afọ mba Gana ahụ e tituburu ugboro abụọ n’agba mbụ nkeRead More →

Ụmụahịa: Dọkịnta Okezie Ikpeazu, Aka na-achị Abịa Steeti akpọọla ọkụ ka Ndigbo tikọta aka iji mepee akụnụba mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ka ndị ntorobịa were nwee ọrụ. O kwuru  nkea n’Obi Gọọmenti Abịa Steeti, n’Ụmụahịa oge ọ na-anabata ndị nnọchiteanya otu a kpọrọ Nzuko Ụmụnna nke onye du ha were bịaRead More →

Enugwu: Aka na-achị Enugwu Steeti, Rt. Hon. Ifeanyịchukwu Ugwuanyị ekwela ndị ọma ndị Enugwu Steeti nkwa na ọchịchị ya ga-agba mbọ eleghị anya n’azụ ịhụ na Hotel Presidential, Enugwu bịaghachitere ọzọ. Ugwuanyị kwupụtara nkea ụbọchị Tọọzdee  abalị iri n’asatọ nke ọnwa a mgbe ọ gara njem ijiri anya ya wereRead More →

Enugwu: Ndi oji egbe madụ anọ kpuchiri ihu nọrọ n’oge o jiri ọkara gata elekere abụọ nke ehihie ụnyahụ bụ Tọọzdee, abalị iri n’asatọ nke ọnwa Julayị were gbaa ụkọchukwu ndị Katọliki egbe n’ụzọ si Nomeh dị n’okpuru ọchịchị Ọwụwa Anyanwụ Nkanụ aga Nenwe dị n’okpuru ọchịchị Aninri n’Enugwu Steeti.Read More →

Abụja: Ebeanọ Dọkịnta Chimaroke Ogbonnịa Nnamani, Gọvanọ chịburu Enugwu Steeti ga-anọ kpọm kwem na ngosipụta Oka Okoro, ejije Nollywood pụrụ iche fọzịrị abalị asatọ. Ngosipụta ejije nkeji otu narị n’iri abụọ a nke ga-enye ndị ọbụla omenala Igbo na-amasị obi ụtọ ga abụ n’ụlọ nkiri onyonyoo Genesis Cinema dị  n’ụzọRead More →

Legọs : Yul Edochie esoghị na ndị eri agọ. N’ozi ịtụ mma o zigara omebe ejije ibe ya bụ Nọnso Diobi na Ncheta Ọmụmụ ya n’ụbọchị Tọọzdee, abalị iri n’asatọ nke ọnwa a n’instagram, o toro Diobi maka izi ya ụzọ mgbe ọ bịara Legọs ọhụrụ. “N’agbata afọ 2005 naRead More →

Onyeisiala Naịjiriya n’oge gara aga, Olusegun Ọbasanjọ na Muhammadu Buharị, onyeisiala Naijiriya na-agbakọrịta egbe ọnụ maka akwụkwọ ozi Ọbasanjọ degaara  Buharị. N’akwụkwọ ozi nke abụọ a, Onye amụma Ọbasanjọ degaara Onye eze Buharị, ọ na-enye ya ndụmọdụ ka o wepụ aka enwe n’ofe iji mee ka agha ghara ịda n’obodoRead More →

Enugwu: Ndi ìsì karịrị otu narị si ụlọ akwụkwọ ndị ìsì dị n’Oji River bụ Oji River School for the Blind anọchiwo ụzọ awara awara ochie si Enugwu gaa Ọka. Ha na-eme ngagharị iwe maka oke ụgwọ ụlọ ọrụ na-ekesa ọkụ bụ Enugu Electricity Distribution Company, EEDC na-amagbunye ha. ỤmụRead More →

Abụja: Ichie Paul Unongo bụbu Onyeisioche otu Northern Elder’s Forum, NEF, ekwuola hoo!haa! na onye ugwu kagaaachịkwa ma Onyeisi ala Muhammadu Buhari rituo n’afọ 2023. Ọ sị na ha ndi Ugwu ga-atọ n’ọchịchị maka oke ụbara ọnụ Ọgụgụ ha,na ọ dịghị njọ bụ ndị Ugwu ịzọ ọkwa onyeisiala ma BuhariRead More →

Abụja: Sinetọ Ọjị Ụzọ Kalụ, Onye Nchịkwa(Chief Whip) otu ndọrọndọrọ APC na Sineti Naịjiriya ma bụrụkwa Gọvanọ chịburu Abịa Steeti ekwupụtawo hoo!haa! na ọ bụ ya webatara Ruga n’Ala-Igbo. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ Sineti n’Abụja n’ụbọchị Tọọzdee gara aga bụ abalị iri n’otu nke ọnwa a. “Mgbe mRead More →