Yola: A gbagbuola onyeisi otu Miyetti Allah, ngalaba Ndịda Adamawa bụ Alahaji Saidu Kolaku ụbọchị Satọdee, abalị atọ nke ọnwa Ọgọọst. Otu onye otu Miyetti Allah na steeti ahụ tinyekwara ndị ọzọ ọnụ na-eru n’okwu na-ahụta ogbugbu ya dịka ịbọ ọbọ megide ndị otu ha.  Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe OjiiRead More →

Enugwu : Ndi Uwe ojii ejidela ụfọdụ ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị gbagburu Ụkọchukwu Pọl Ofu. Kaosiladi, ha ekwughị ndị ndị ahụ bụ ma ọ bụkwanụ ole ha dị ruo oge anyị zipụrụ ozi a. N’okwu ya ụbọchị Satọdee, abalị atọ nke ọnwa Ọgọọst, Kọmishọna Ndị UweRead More →

Saụt Afrịka: Ndi oji egbe gbagburu otu nwoke onye Igbo ọzọ n’isi ụtụtụ taa, abalị atọ nke ọnwa Ọgọọst na Johanesbọg, Saụt Afrịka. Nwoke a bụ Benjamin Saịmọn Okoronkwọ, onye Ebọnyị Steeti bụ onye na-anya ụgbọ ala n’ụlọ ọrụ taxify. Nwoke ahụ nọ n’ime ụgbọala ya mgbe ndị ahụ gbagburuRead More →

Kalaba: Ègwù dị ugbua na obodo dị n’ikpere mmiri Itu n’okpuru ọchịchị Odukpani nke Krọs Riva Steeti  ebe ndị a na-eche na ha bụ ndị otu Biafra Nations Youth League, BNYL, na ndị Fulani na-achị ehi na-akwarịta mgbọ. hoo!haa!! na o teela ndị Fulani na-achị ehi ji echi ndị obodoRead More →

Legọs : Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na ndị ọrụ nchekwa DSS nọrọ n’ụtụtụ taa were kpụrụ Mazị Omoyele Sowore bụ onye ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị AAC zọọ ọkwa na nhọpụta onyeisiala emere n’ọnwa Febrụwarị a be ya na Legọs. Ihe e ji kpụrụ ya bụ maka ngagharị iwe mgbanweRead More →

Abụja: Onye ohi a na-achụ onye ohi? Mba. Mana Sineti ala anyị emeela Sinetọ na anochite anya mpaghara Mgbago Ugwu Sokoto, Aliyu WAMMAKO onyeisioche Kọmitii na-ahụ maka EFCC n’agbanyeghị na ụlọ ọrụ EFCC na-enyocha ya bụ nwa amadị maka iri ngarị Njeri Naira Iri n’ise (N15billion) Nwa amadi a buRead More →

Onye nta akụkọ – Chụkwụdị Okeke Ọnịcha: Mmadụ anọ ji ụgbọala, ya bụ ndị “One Chance” ka a nwuchirikọrọ na Nkwele Ezunaka dịdebere Ọnịcha ụnyahụ bụ Tọọzdee, abalị mbụ nke ọnwa Ọgọọst oge ha chọrọ ịnapụ otu nwanyi ihe karịrị Narị Puku Naịra iri anọ (N400,000). Nwanyị a aha yaRead More →

Onye nta akụkọ – Chụkwụdị Okeke Enugwu:  Njinji jiri ụnyahụ oge ndị e chere na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi gbagburu ụkọchukwu ndị Katọliki n’Enugwu na mgbede Tọọzdee abalị abụọ nke ọnwa Ọgọọst. Fada Pọl Ofu ka a gbagburu ka o ji ụgbọala aga n’ụzọ si Agbụdụ aga IheRead More →

Meiduguri: Igbo sị na “asị gwụ ekperime n’ọnụ, a kpụrụ ya gbuo”. Ka ọ dị taa, asị Gọọmenti Etiti na-asịzi maka agha Boko Haram mere na a maghịzi nke bụ eziokwu. Ozi hoo!haa!! nwetara site na-egosi na enweghị eziokwu ọbụla dị n’okwu Onyeisiala Muhammadu Buhari oge gara aga oge ọRead More →

Enugwu : Ọkaiwu Benjamin Ọnwụka, Onye ndu otu Biafra Zionists Federation (BZF), emeela onwe ya Onyeisiala Bịafra, n’agbanyeghị na e nwetebeghi ya bụ mba Bịafra. O kwupụtara nkea n’ozi o zigara ndị nta akụkọ ka ndị Uwe ojii gbochiri ya idu onwe ya n’iyi ọrụ dịka Onyeisiala Bịafra n’Enugwu n’ụbọchịRead More →

Abụja: Otu onyeisi n’ụlọ ọrụ West African Examination Council (WAEC), Osidehinde Adewunmi,nọrọ ụbọchị Wenezdee, abalị iri atọ n’otu nke ọnwa Julayị were kọwaa na asambodo Cambridge University’s Moderated International Examination nke Onyeisiala Muhammadu Buhari wetara n’ihu ụlọikpe nhọpụta onyeisiala dịka ihe akaebe bụ adigboroja. Akwụkwọ abụọ a nabatara dịka AkaebeRead More →

Abụja: A kpọlitewo Sinetọ Ifeanyị Ụba dịka Osote Onyeisioche Kọmitii na-ahụ maka  Ngwupụta Mmanụ Agbidi nke Sineti ala anyị. Sinetọ Ụba na-anọchite anya mpaghara Ndịda Anambara ma bụrụkwa sọọsọ ya bụ onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị Young Progressives Party (YPP) nọ na Sineti Naịjiriya. N’okwu ka a akpọlitechara ya n’ọkwa ahụ,Read More →

Abụja: A kọwaala na ejije omenala dị oke mkpa ugbua na ndụ Ndigbo maka ọnọdụ ha taa na Naịjiriya. Dọkịnta Okwesịlịeze Nwodo, Gọvanọ chịburu Enugwu Steeti ochie ma bụrụkwa onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP n’ala anyị n’oge gara aga kwupụtara nkea na mmemme ngosipụta mbụ ejije ọhụrụ a kpọrọ ỌkaRead More →

Ịndoneshiya: Aka akparala otu nwoke bụ onye nche n’ụlọ nleta anụmanụ (zoo) dị na Surabaya na mba Ịndoneshiya maka ịkwasa ụmụ anụmanụ iko nke na ọ tụwazịrị utobo ime. Ozi si n’ụlọ mgbasa ozi “the Kalimantan Press” sịrị na ya bụ nwoke, Serelat Ingul Adha, onye dị iri afọ atọRead More →