AKỤKỌ ỤWA
AZỌPỤTALA NWA A MỤRỤ ỌHỤRỤ ATUFURU N’ỤLỌ MPOSI N’ỤLỌ ỤKA


Ndi Uwe Ojii azọpụtala nwatakịrị nwanyị a mụrụ ọhụrụ nke nne ya tufuru n’ụlọ mposi dị n’ụlọ ụka.
Nwatakịrị ahụ dị ihe dị ka abalị anọ ka nne ya tufuru n’ụlọ ụka Ndị Katọliki Rioma dị na Marani, Kisii na mba Kenya.
Ozi si n’aka Ndị Uwe ojii mba ahụ na-ekwu na ekuputere nwa ahụ na ya bụ ụlọ mposi ka a nụrụ ka ọ na-ebe akwa n’ihe dịka elekere abụọ n’ọkara nke ehihie ụbọchị Tuuzdee, abalị iri na asatọ nke ọnwa Eprel afọ a.
Nsogbu ụwa! Nwa ụfọdụ na-achọ elu na ala, ma na be mmụọ ma na be mmadụ, ka ụfọdụ mụtara tufuo. Chukwu Daalụ na nne ya emepughi ya emepu.