BISHỌỌPỤ KWASARA M ÌKÓ N’IKE UGBORO ABỤỌ – ỤKỌCHUKWU NWANYỊ


Legọs – Ótù ụkọchukwu nwanyị dị afọ iri abụọ na atọ anọrọla ụbọchị Tuuzdee n’ụlọ ikpe dị n’Ikeja, Legọs Steeti were kwuo etu Bishọọpụ Daniel Oluwafeyiropo nke Reign Christian Ministry siri kwasa ya ìkó n’ike ugboro abụọ.
O kwuru na ọ bụ n’ụlọ ya dị na Ikota Villa, Lekki n’abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Juun, afọ 2020 ka nwoke ahụ o were ka nna ya n’ime Chineke nọrọ were kpaa ya bụ arụ.
“Bishọọpụ kwachiri ma gbalitesie Televishọọnụ ya ike, ka a ghara ịnụ mkpu m na -eti tupu o jituo m n’elu oche were kwasa m ìkó n’ike.
“Ọ gwakwara m na m ga-ayịwa ara ma m kwuo ihe mere. Ọ kpọchidere m n’ime ụlọ, ebe ọ nọrọ dinakwaa m n’ike nke ugboro abụọ.”
Kaosiladi, ya bụ Bishọọpụ bụ nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu gwara ụlọikpe ahụ na aka ya dị ọcha n’ebubo ahụ a na-ebo ya.
TỤFỊAKWA!