NKE NA-EME UGBUA

BISHỌỌPỤ ỌNA GA-EJE NGA MAKA OKWU CHUKWU KPALITERE ỌGBAGHARA – GANDUJE

Kano: Onye ndụmọdụ mgbasa ozi Gọvanọ Abdullahi Ganduje nke Kano Steeti, Salihu Tanko Yakasai akpọkuola ndị ọrụ nchekwa State Security Service n’Enugwu Steeti ka ha kpụrụ Bishọọpụ Gọdịfrị Igwebuike Ọna nke ụka Katọliki na Dayọsisi Nsụka maka “ịkpalite ọgbaghara site n’okwu Chukwu ya”

Bishọọpụ Ọna nọrọ n’okwu Chukwu ya ụbọchị ụka were katọọ ịkpa oke ndị ọrụ nchekwa na-akpa n’usoro ha si eleba anya na nsogbu nchekwa na Mgbago Ugwu nakwa Ndịda ala anyị.

Ọ rụtụrụ aka na – etu ndị ọrụ nchekwa siri wakpo ndị ótù IPOB n’Enugwu.

Bishọọpụ Ọna kwukwara na ụlọ ekpere ndị Alakụba na etolite ebe nile n’Ala-Igbo ebe ọ hịara nnukwu ahụ inweta ala maka ịrụ ụlọ ụka n’Ugwu Awụsa.

N’ozi ya na Twitter, Yakasai kwuru na Bishọọpụ Ọna kwesịrị ikpe ikpe jekwaa nga maka ịkpalite ọgbaghara.

Show More

Related Articles

One Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close