BUHARI AGWALA NDỊ NLEKỌTA MAHADUM KA HA CHỤỌ NDỊ NKUZI NA-ACHỌ IDINA ỤMỤ AGBỌGHỌ HA NA – AKUZI



Ile-Ife: Onyeisiala Naịjiriya, Muhammadu Buhari agwala ndị nlekọta mahadum dị iche iche n’ala Naịjiriya ka ha chụọ ndị nkụzi mahadum ndị nwoke na-achọ idina ụmụ agbọghọ ha na – akuzi tupu ha agafe n’ule
Buhari kwuru nke a ụbọchị Satọdee na mmemme nnweta nzere mmụta nke iri anọ na isii nke mahadum Ọbafemi Awolowo, Ile-Ife, Osun Steeti.
Buhari, onye nke Dọkịnta Abịọdụn Saliu, onye bụ Onye Nlekọta na-ahụ maka Nhazi Usoro Agụmakwụkwọ (Director, Academic Planning) na Kọmịshọọnụ ala anyị na-ahụ maka Mahadum, National University Commission kwuru nkea.

O kwuru sị, “E kwesịghị iwere ọdịnihu nke ụmụ agbọghọ ọbụrụ ha na – anụ nọgasị na mahadum dị iche iche n’ala Naịjiriya tinye n’aka ụmụ nwoke akwara ha na-akwagharị, ndị sị na ha bụ ndị nkuzi mahadum.
Buhari tokwara ndi nlekọta mahadum ahụ maka mbọ ha gbaworo iji hụ na ndị nkuzi mahadum ụmụ nwoke ndị ahụ na-eme ka nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu nwetara ntaramahụhụ kwesịrị ekwesị.
