AKỤKỌ ỤWA

BUHARỊ ỊCHỌ ITINYE LỌRỊTA ONOCHIE NA INEC BỤ ỊKPA AGHARA-CAN

Abụja: Ótù jikọtara ndị ụka n’ala Naịjiriya, Christian Association of Nigeria(CAN) akatọọla mkpọlite n’ọkwa nke Onyeisiala Muhammadu Buharị chọrọ ịkpọlite Lọrịta Ọnọchie, Onye Inyeaka n’okwu mgbasa ozi Ọbaozi dịka Kọmishọna ga-anọchite anya mpaghara Ndịda Ndịda n’ụlọ ọrụ ime Nhọpụta INEC dịka “ịkpa aghara nakwa oke mkparị nye Iwuala Naịjiriya nke Afọ 1999”

Ozi si n’aka Onyeisi ótù CAN, Dọkịnta Samson Ayokunle kpọrọ òkù ka Sineti Naịjiriya jụ mkpọlite n’ọkwa ahụ ụwa nile maara dịka “ọkụkọ ávụ̀ké”

O kwuru sị, “CAN hụtara Ọnọchie dịka onye eziokwu adịghị n’ọnụ. Ịbụkwa onye ótù ndọrọndọrọ ọchịchị a maara ama megidere itinye ya na INEC.

“Anyị achọghị ya maka ajọ ọnụ ya, etu o si eji okwu na-akọ ọkọ na ntị akparị ndị welitere isi n’obodo, oge ọbụla ha kwuru ihe megidere nna ya ukwu bụ Buharị”

Sineti nọkwa ụnyahụ were jụ mkpọlite n’ọkwa nwanyị ahụ nke na-adazị okwu

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close