Abiokuta – Ngalaba ndị Uwe Ojii na-achụ ndị oji-egbe-ezu (SARS) egbuola onye ọgba bọl nke otu egwu bọl Remo Stars, Tiyamiyu Kazeem, n’ebe Orile Imo dị n’ụzọ awara awara Shagamu – Abiokuta, Ogun Steeti ụnyahụ. Ndị Uwe Ojii ahụ jidere ya na ọ bụ onye ‘yahoo’ oge ya na onyeRead More →

Legọs – Ọtụtụ mmadụ akatọọla okwu Ụkọchukwu Enọk Ade Adeboye, Onye Nlekọta Gburugburu, Ụlọ ụka Redeemed Christian Church of God (RCCG) maka ozi ya na Twitter ebe o kwuru sị, “Ụmụ m nwoke, unu anụla nwanyị amaghị esi nri. O kwesịrị ịma ịrụ ọrụ ụlọ nakwa isi nri maka naRead More →

Abụja –  Ichie Dọkịnta Chekwas Okorie( Ojeozi Ndigbo), Onyeisi Oche otu Ndọrọndọrọ Ọchịchị United Progressives Party (UPP) eduruwo ndị otu ya makpuo n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị nọ n’ọkwa na Naịjiriya taa bụ All Progressives Congress (APC). Nke mkpebi ọgbakọ ndị nlekọta nakwa ndịsonwere UPP nwere taa bụ Tọọzdee, abalị iri abụọRead More →

Ado Ekiti – Kọmishọna na-ahụ maka Ikpe Nkwụmọtọ n’Ekiti Steeti, Mazị Olawale Fapohunda ekwuola na Gọvanọ Steeti ahụ  Kayọde Fayemi enyela ntụziaka ka a tụgharịa iwu hiwere atụmatụ nchekwa Amotekun nakwa ndị ọzọ nke Steeti ahụ n’olu Yoroba. Usoro iwu nke e ji ehiwe atụmatụ nchekwa a kpọrọ  Ekiti StateRead More →

Enugwu – Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Enugwu Steeti akpọkuola Gọọmenti Etiti ka ọ napụ ụlọ ọrụ nkesa ọkụ EEDC ikike ịbụ sọọsọ ụlọ ọrụ nkesa ọkụ dị na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda Naịjiriya. Ụlọ Nzukọ a katokọwara ụlọ ọrụ EEDC maka edebeghi iwu ụlọ ọrụ NERC etu o siri metụta ndịRead More →

Nsụka – Ọkụ adogbuola otu “onye barrow” na Nsụka ụnyahụ ka ọ gara ịghọta mangoro n’akụkụ ụdọ ọkụ “High Tension” n’ụzọ bịawara Enugwu. Chetakwa na Onyeisi oche Okpuru Ọchịchị Nsụka, Oriakụ Chinwe Ugwu nwere ndị ntorobịa ọ kwalitere ndụ ha afọ gara aga site na ibunye ha barrow ka haRead More →

Ndigbo ka Onyeisiala ruuru mana…  Legọs – Ichie Bode Jọọji, onye bụbu Osote Onyeisi Oche otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP n’ala anyị ma bụrụkwa otu onye n’ime ndịsonwere PDP ekwuola hoo!haa!! na kama ya ga anọ Alahaji Bola Tinubu abụrụ Onyeisiala Naịjiriya, ya alaa Togo ma ọ bụ mba ọzọ gaRead More →

Legọs – Ọchịagha Ukwu nke ndị agha Naịjiriya,  Lt. Gen. Tukur Buratai, ekwuola hoo!haa!! na ndị Boko Haram abatawo Legọs tinyekwara ebe ndị ọzọ nile na Naịjiriya. N’okwu ya na Arise TV, Buratai kwuru na ndị oyiọhaegwu (terrorists) a ndị a chụpụrụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ugwu ala anyị kwagazịrịRead More →

Maka Ịzọ mba igbu ụmụ kọmishọna ndị Uwe Ojii n’Abịa Steeti  Ụmụahịa – Mazị Nnamdi Kehinde Kanụ, Onyeisi otu IPOB nọrọ na Twitter were rịọ m gbara maka ịzọ mba igbu ụmụ Kọmishọna ndị Uwe Ojii n’Abịa Steeti, Mazị Ene Okon, ma o nwere ihe mere onye IPOB ọbụla bịaraRead More →

Enugwu –  Gọvanọ Hope Ụzọdịmma nke Imo Steeti abịaghị Ọgbakọ ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda mere ụnyahụ bụ ụka, abalị itoolu nke ọnwa Febrụwarị afọ 2020, n’Obi Gọọmenti Enugwu Steeti. O nweghịkwa onye o zitere ka ọ nnọchiteanya ya. Nke a gbara Ndigbo gbarịị dịka ahụ ijiji nyụrụ n’elu.Read More →

Enugwu – Igbo nile ekpebiela ihiwe otu nchekwa nke ga-echekwa ndụ n’akụnụba ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda. Nkea sitere na mkpebi ọgbakọ abụọ e mere n’Enugwu ụnyahụ bụ ụka nke gbadoro ụkwụ n’otu isiokwu :Nchekwa Ala-Igbo. Na mbụ, Imeobi Ọhaneze nwere ọgbakọ n’Ụlọ Nkwari akụ Nike Lake, Enugwu. Ndị nileRead More →

Enugwu –  Ihe karịrị otu puku mmadụ bịara sonyere Lọlọ Ugoezue Pat Agụbụzụ bụ  nwunye Igwe Lọrịns Agụbụzụ, Eze Ọgbụnechendo n’Ezema Olo ma bụrụkwa Onyeisi oche ndị Eze n’Enugwu Steeti taa na  mmemme ncheta ọmụmụ ya nke iri afọ asaa ya. E jiri ụka a kara n’ụlọ ụka Katọliki AtọRead More →

Meiduguri – Ọkammụta Babagana Umara Zulum, Gọvanọ na-achị Boronu Steeti ebuliwo Oriakụ Ọbịageri Mazị, onye nkuzi o zutere n’Ụlọ akwụkwọ Praịmarị Shehu Sanda Kyarimi dị n’Okpuru Ọchịchị Jere n’elekere isii n’ọkara nke isi ụtụtụ n’ọkwa. Ọkammụta Zulum gbara ụzọ bịa ụlọ akwụkwọ ahụ n’ije ntụmadị mana ọ tụrụ ya n’anyaRead More →