Ọka – Sinetọ Dọkịnta Kris Nwabụeze Ngige, Mịnịsta Naịjiriya na-ahụ maka Ọrụ nọrọ na nso a were nye ndị obodo ya bụ Alọ, n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Idemili nke Anambara Steeti ngwa nbelata nhịamahụ ọrịa koro. Ngige mere nkea site n’ótù Sen. Chris Nwabueze Ngige Foundation, Alor London. Ihe o kereRead More →

Owere – Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ísí mgbaka mere Dọkịnta Tiofilọsụ Okere, onye bụbu Onye Nlekọta ụlọ mgbasa ozi Imo Broadcasting Corporation (IBC), Owere ji sụgbuo nwunye ya. Okere, onye dị afọ iri asatọ n’ise nọrọ ụnyahụ na be ya dị n’Imerienwe n’Okpuru Ọchịchị Ngor-Okpala nke ImoRead More →

Abakaliki –  Ụkọchukwu Okochi Obeni nke Ụlọ ụka God’s Descendants Assembly, Amasiri, dị n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Afikpo, onye ndị akpụ obi tiri gwoo gwoo ma gbakwaa ya mmiri si n’ọwa mmiri (gutter) ekwuola na ndị Dọkịnta na-ekwu na o nwere ike ịdazị ngwụrọ, ma a kpaghịrị anya. Obeni, onye bụkwaRead More →

Pakistan – Ótù onye n’ime mmadụ abụọ lanarịrịnụ na mberede ụgbọelu mere na Karachi, mba Pakistan ụbọchị Fraịdee ekwuola na ya mapụturu n’ime ụgbọelu ahụ ka ọ na-agba ọkụ. Mohammed Zubair, onye dị afọ iri abụọ  n’anọ kọwara ihe mere. “Ka ụgbọelu kụrụ, e nwetere m onwe m were hụRead More →

Anyị amalite ngagharị iwe kpụ ọkụ n’ọnụ  Abiokuta – Otu National Association of Nigerian Students (NANS) akatọọla atụmatụ Gọọmenti Etiti Naịjiriya nwere nke ha ji akọ akụkọ ịmalitekwa inye ụmụ akwụkwọ nri n’oge Mkpọchi Obodo ọrịa koro dịka ohi nakwa iri ngarị. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụbọchị Fraịdee,Read More →

  Ụmụahịa – Ụlọikpe nọ n’Ụzọakọlị, Abia Steeti nọrọ ụbọchị Tọọzdee were tọhapụ Striker, Nnamdi Obi, onye nọ n’ụlọ nga kemgbe ọnwa isii. Ndị Uwe Ojii jidere ya na ndị otu ya mmadụ abụọ ndị ọzọ n’abalị asatọ nke ọnwa Disemba, afọ 2019 n’ụzọ MCC, n’aha, Abia Steeti maka ịbụRead More →

Abakaliki – Gọvanọ Devid Ụmahị nke Ebọnyi Steeti nọrọ ụnyahụ were kwuo na ya ogbo ya nke Enugwu Steeti, Ifeanyị Ugwuanyi, ekpebiela ịrụ ọnụ ụzọ ámá n’okeala ha iji hụ -na ndị njem anaghị agafe maka mgbochi  ọrịa koro. Ụmahị kwupụtara nkea n’okwu ọ gwara ndị  Steeti ahụ nile banyereRead More →

Wọrị – Nwanyị onye ọcha, onye Amerịka dị iri afọ isii n’asaa bịara ịhụ iko ya onye nwa Naịjiriya anwụọla n’Ọrịa Koro ụbọchị ụka n’ụlọ ọgwụ na Delta Steeti. Ozi hoo!haa!! nwetara gosiri na nwanyị ahụ na iko ya nọ n’ụlọ nkwari akụ n’Osubi, Orerokpe dị n’Okpuru Ọchịchị Okpe kemgbeRead More →

Nsụka –  Egbeigwe egbuola ụmụaka abụọ nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị, ma merụkwaa mmadụ abụọ ndị ọzọ ahụ na Nsụka, Enugwu Steeti. Ụmụaka ndị ahụ nọ n’agbata afọ iri n’abụọ nakwa afọ iri n’ise bụ ndị  Ụmụnkashi dị n’Okpuru Ọchịchị Nsụka. Ụmụaka abụọ ahụ laworo mmụọ aha bụ Asogwa Nnadozie, onyeRead More →

Mịna – Otu onye “Councillor” n’Okpuru Ọchịchị  Katcha, na Naịja Steeti abụrụla onye a na-akpọ achọ maka iburu ọtụtụ akpa ngwa nri dịka osikapa, ọka nakwa dawa dị akpa narị atọ o kwesịrị ike ndị mpaghara ya. Odeakwụkwọ Ukwu Steeti ahụ, Alhaji Ahmed Ibrahim Matane, Onyeisi Oche otu Kọmitii ỌrịaRead More →

Nsogbu mkpọchi obodo so ọrịa koro emeela ka otu di na nwunye na mba Yuganda were nwayọọ jiri ụkwụ gaa ma latakwa ụbọchị agbamakwụkwọ ha. Ihe kpatara nkea bụ maka Mmachi a machiri ụgbọala ọbụla ịgba n’ụzọ maka mkpọchi obodo ọrịa koro. Nwoke na-agba akwụkwọ, Zoen Harrold nwa-afọ mba AmerịkaRead More →

Otu onye dibịa na-ewu ewu na mba Gana aha ya bụ Jojo (Miracle Wonder) ka anyị nụrụ na ọ tụwala nwunye otu ụkọchukwu onye Igbo, Ụkọchukwu Sọnde Ike ime. Ọhaneze na-ajụzị “kedụ ihe jikọrọ udele na onye ọ́kpụ̀ isi?” Kedụzi ebe mmiri si baa n’opi ụgbọrọ? Akụkọ anyị na-enweta bụRead More →