Taa bụ abalị itoolu nke ọnwa Julayị bụ Ncheta Ọmụmụ Oriakụ Dumebi Ọjị. Dumebi bụ onye Ndikeliọnwụ dị n’okpuru ọchịchị Orumba nke Mgbago Ugwu, Anambara ma a lụ ya n’Emudo-Nenwe dị n’okpuru ọchịchị Aninri, Enugwu Steeti. Ozi ekele ya:” A na m ekele Chineke onye dewere m ndụ wee ruoRead More →

Abụja: Ndị nile omenala Ndigbo nakwa ejije Nollywood na-amasị ga-ezukọta n’ụlọ onyonyoo Genesis Cinema dị na  Novare Gateway Plaza(Shoprite), Abuja n’ụbọchị Satọdee, abalị iri n’abụọ n’asaa nke ọnwa Julaị maka ngosipụta mbụ nke Ọka Okoro. Ọka Okoro bụ ejije banyere ihe mere eme n’obodo Nenwe dị n’okpuru ọchịchị Aninri n’EnugwuRead More →

NCHETA ỌMỤMỤ ORIAKỤ NNEKA IBEKWE  Taa bụ ụbọchị ụka nkwọ abalị asaa nke ọnwa Julayị ka ORIAKỤ NNEKA EDITH IBEKWE na – eme Ncheta Ọmụmụ ya nke iri afọ anọ n’isii ya. Neky, dịka ndị enyi nakwa ikwu n’ibe si akpọ ya bụ Ada Ekwuluọbịa mana ije di bugara yaRead More →

Enachoken Eze Kalu Kalu Ogbu (IV) ekwupụtawo mkposa ekposara ndị ọchịchị nọbu n’isi otu Abiriba Communal Improvement Union (ACIU) nke Mazị Eke Agbai nọ n’isi ya. N’okwu ya n’oge “Itu Eye” nke e mere n’ezi Amaukwu, Amaeke, Abiriba iji merube Mmemme Iriama nke afọ a e mere na ngwucha izu ỤkaRead More →

Abuja: Otu Nenwe Integrity Foundation (NIF) nọrọ ụnyaahụ, abalị iri abụọ n’abụọ nke ọnwa Juun nke afọ a n’ụlọ ezumezu ndị agha a na-akpọ Army Headquarters officer’s Command Mess 1, Abuja were kwanyere Osote Onyeisi ndị Uwe ojii na Naịjiria bụ DIG Godwin Nwobodo ugwu maka mbuli n’ọkwa ya. NdịRead More →

Enugwu: Ụlọ erimeri Sizzlers nke nọ n’ogige Polo Park Mall kpọtụrụ akpọtụ n’ụbọchị Wenzdee, abalị iri n’abụọ nke ọnwa Disemba afọ 2018 mgbe Injinịa Agọzie Ibekinwa mere mmemme ncheta ịgba afọ ya. Mazị Agọzie Ibe onye nke e ji “Energy” mara kelere Chineke maka ihe ọma nile o mere ya.Read More →

Johannesburg: N’ụbọchị Orie bụ abalị isii nke ọnwa Ọktoba ka Ndigbo bi na mba Saụt Afrịka nọrọ n’ogige Observatory Sports Club na Johannesburg were mee mmemme Ịwa Ji nke afọ a. N’ezie, Ịwa Ji Saụt Afrịka nke afọ a kpụ ọkụ n’ọnụ. Ndigbo bi na mpaghara itolu nke mba SaụtRead More →

A nọrọ ụnyahụ bụ Sọnde, abalị iri nke ọnwa Juun, n’ụlọ ụka ndi Anglican nke St Faith dị n’Ezele,Ọba nke nọ n’Okpuru ọchịchị Ndịda Idemili nke Anambara Steeti were kaa ụka iji cheta otu afọ e jiri mee akwamozu otu onye Ndigbo ji eme ọnụ bụ Ọkammụta Benedict Ebele Ọbụmselụ.Read More →

Mmemme ụbọchị Omenala ndi ụlọ akwụkwọ Kings High school dị n’Emene, Enugwu mere n’abalị iri n’asaa nke ọnwa Maachị afọ a. Obere Maazị Chukwuebuka Nweze bụ onye gụrụ “OMEKA AGỤ”, egwu ochie dike n’egwu Igbo bụ Maịk Ejeagha nke ọma iji mee ọhaneze bịara ebe ahụ obi ụtọRead More →