CBN AGBACHIELA Ọ́DỌ́ EGO ỤLỌ AKỤ NKE NDỊ NCHỊKỌBA #ENDSARS


Ụlọakụ Etiti Naịjiriya, Central Bank of Nigeria (CBN) agbachiela ọ́dọ́ ego ụlọ akụ ndị isi ndị chịkọbara ngagharị iwe #EndSars.
Òtù onye n’ime ndị atụmatụ a metụtara bụ Nwaada Oluwarinu Oduala, onye bụ onye nnọchiteanya ndị so mee ngagharị iwe #EndSars n’òtù nnyocha maka Nkwafu Ọbara Leki.
Ọgbakọ òtù ahụ enweghị isi taa bụ Satọdee maka na Nwaada Oduala jiri iwe ihe ahụ Ụlọakụ Etiti mere were gbaa abụbọ ọrụ n’ọgbakọ ahụ.
Onyeisi Oche òtù Nnyocha ahụ, Ọkaikpe Doris Okuwobi, laworo ezumike kwuru na ha agaghị enwekwa ọgbakọ ụbọchị ahụ maka na ọnụ ọgụgụ ndị òtù ahụ ezughikwa oke ma agụpụ Nwaada Oduala.
Ọtụtụ mmadụ akatọọla ya bụ ihe Ụlọakụ Etiti Naịjiriya mere, nke dịka “ibo mmadụ nnu hakpo ya mmiri”.
Kedu ka onye gị na ya nwere okwu ga-esi nọrọ n’ọgbakọ mkpezi ị kpọrọ ya, ị ga dinye ndị mụnyere ụlọ ya ọkụ? Mbanụ!