AKỤKỌ ỤWA
CGPA 5.0: OGE ỌZỌANỊ EDEBEWO ÀTỤ̀ NA MAHADUM MBA RỌSHỊYA


Nwaada Ogechukwu Ọzọanị edewo àtụ̀ site na inweta Mkpokọta Akara Ule (CGPA) dị 5.0 na, Mahadum Kazan National Research Technological University na mba Rọshịya.
Nke a gosiri na o nwetazuru akara nile mmadụ pụrụ inwetanwu n’ule mahadum, n’enweghị nke ọbụla ọ dara iji nwee klaasị nke mbụ (First Class).

O nwebeghị onye ọzọ kpara udiri ike a kemgbe mahadum ahụ malitere.

Ogechukwu bụ onye Enugwu Ngwo dị n’Enugwu Steeti mana o bi na Kazan dị na Tatarstan, Rọshịya.
Hmm, Igbo dị egwu!