Uncategorized
CHAI! AGADI IRI AFỌ ASAA NA OTU ANWỤỌLA N’ELU AKWỤLA



Abiokuta: Ebelebe gburu ụbọchị Tọzdee na Shagamu, Ogun Steeti oge ótù agadi nwoke dị afọ iri asaa na otu, Ajibola Olufemi Adeniyi nọrọ n’elu akwụla nwụnyụọ anya ka ha na-enwe mmekọahụ kpụ ọkụ n’ọnụ.
Ebe ya bụ ihe nọrọ mee bụ n’ụlọ ndị akwụla a na-akpọ 50/50 hotel, Ogijo dị n’Okpuru Ọchịchị Shagamu.
Nwoke ahụ, onye bi na Bariga, Legọs Steeti bịara ka ya na ótù akwụla, Joy “gwuo egwu n’elu àkwà”
Ozi hoo!haa!! nwetara na – ekwu na ndị Uwe ojii bịara buga ozu nwoke ahụ n’ọba ozu nke Ụlọ ọ́gwụ̀ Ukwu dị na Shagamu. Ha kpụrụ akwụla ahụ kpọchie, ka ọ kọọ etu nwaamadị ahụ siri nwụọ.
Ndị nta akụkọ enwetanwughi Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe ojii na Steeti ahụ, Abimbola Oyeyemi n’ekwentị tupu e zisaa akụkọ a.