AKỤKỌ ỤWA
CHAI! E ZURUWO OCHE NKWAGHARỊ NWANYỊ NGWỤRỌ


Olivia Nakugudo, nwanyị onye ngwụrọ dị afọ iri atọ n’abụọ nọzị na gbagharịa ugbua kemgbe ndị ohi zuru oche nkwagharị ya n’abalị Tuuzdee na Mbale nọ na Yuganda.
Ndi ohi ahụ zuru ihe ndị ọzọ tinyere oche nkwagharị ya o ji agagharịnwu.
Nwanyị ahụ kwuru sị, :
“E nweghị m ụkwụ, oche nkwagharị ahụ bụ ụkwụ m, ụmụ m ndị chekwubere na m maka nri na ihe ndị ọzọ e ji ebi ndụ ga-akwụzị agụụ”
N’ihi ya bụ oche nkwagharị e zuru, ọ ganwughi ọrụ na Kyalaganyi Coffee bụ ebe ọ na-arụ.
Nakugudo na-arịọzị onye ọbụla hụrụ oche nkwagharị ahụ na-eji òjí, ebe mbikwasị aka ya na-acha anụnụ anụnụ (blue) ka o mee ebere bughachite ya.