AKỤKỌ ỤWA

CHAI! ENYI AZỌGBUWO NWOKE PANYA BỊARA NJEM NKIRI ANYA NA SAWỤTỤ AFRỊKA

Enyi nọrọ n’ụtụtụ ụbọchị ụka a were zọgbuo nwata nwoke onye Panya (Spain) nọ njem nkiri anya na Sawụtụ Afrịka, oge o si n’ụgbọala ya rituo were gaa nso ísè obere ìgwè enyi onyonyoo n’ogige ngaghari ụmụ anụmanụ a kpọrọ Pilanesberg National Park, nke dị kilomita narị abụọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Mgbago Ugwu Johannesburg.

Ozi hoo!haa! nwetara na-ekwu na nwata nwoke ahụ laworo mmụọ, onye dị afọ iri anọ na atọ, na nwaanyị ọ chọrọ ịlụ na ụmụ nwaanyị abụọ ndị ọzọ ji ụgbọala ha agafe n’ime Ogige Ngaghari ahụ tupu ha ahụ enyi atọ na ụmụ ehi atọ.

Ọnụ na-ekwuru ndi Uweojii na mpaghara ahụ Sabata Mokgwabone kwuru sị, “Ozi anyị nwetara na-egosi na nwoke ahụ si n’ụgbọala ya rituo, were gaa ìgwè enyi ahụ nso ísè ha onyonyoo mere ha jiri wakpo ma gbuo ya”

Pieter Nel, Onye Nlekọta Ukwu nke Ngalaba maka Ogige Ngaghari Anụmanụ na Njem Nkirianya na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Mgbago Ugwu Sawụtụ Afrịka kwuru na iwe were nne ìgwè enyi ka onye njem Nkirianya ahụ bịara nso maka na ọ chọrọ ichekwa ụmụ ya.

Ogige Ngaghari Anụmanụ Pilanesberg na ndi ọzọ nọ na mba ahụ na enye ndi njem Nkirianya adọm aka na ntị ka ha kpọchisie mgbúpú (windows) ụgbọala ha, gharakwa iritu chaa chaa.

Chai! Ọ kwa “ka eletachaa mere mgbọ ji tụọ ènwè n’isi”. Nwoke ibe m, ka mkpụrụobi gị zuru ike na ndokwa. Iseeeeeee!

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close