AKỤKỌ ỤWA
CHAI! KWASHỊỌKỌ JIZI ỌDỤM NỌ N’OGIGE ỤMỤ ANỤMANỤ MAHADUM OAU, IFE



Osogbo: Onyonyoo ọdụm ndị nọ n’ogige ụmụ anụmanụ Mahadum Obafemi Obafemi Awolowo (OAU), Ife, Osun Steeti agụụ na-emekpa ahụ ewusaala ebe nile n’ọba ozi mmekọrịta dị iche iche, ọ kacha n’Instagram.
Ọdụm abụọ ahụ dị ka ihe kwashịọkọ na-egbu, ọkpụkpụ ha nile pụtachara nke na onye na-eleghi anya ọfụma agaghị ama na ha bụ ọdụm.
O wutere ọtụtụ mmadụ nke mere na ótù onye dere sị, “Kedụ ihe mere e ji ata ụmụ anụmanụ ndị a udiri ahụhụ a? Ọ bụrụ na nri a ga-enye ha adịghị, ọ ka mma ịtọhapụ ha, ka ha chọwa ihe ha ga-eri”
Chai! Agụụ akarịa la n’obodo Naịjiriya. Ọ kwa mmadụ richaa tupu anụmanụ eriwe.