CHAI! NDỊ (IPOB) M NA-AZỌCHITERE KEMGBE NA-EZITEZIRI M OZI OGBUGBU – ALOY EJIMAKỌ


Ọkaiwu Aloy Ejimakọ, Ọkaiwu pụrụ iche nke Mazi Nnamdi Kanu, Onyeisi òtù IPOB anọrọwo n’ozi ya na Twitter were tie mkpu na oke mwute maka ozi ogbugbu ọ na-anatazi.
N’agbanyeghị na o kwughi ndị na e zitere ya ozi ahụ, ọ sịrị na ozi ndị ahụ si n’aka “ndị ọ na-azọchitere kemgbe afọ ole na ole” gosiri na ozi ahụ si n’aka ụfọdụ ndị IPOB.
Cheta na okwu banyere nkagbu atụmatụ Onye Nọrọ Be Ya kwa ụbọchị Mọnde, were ruo na a tọhapụ Mazi Nnamdi Kanu butere ezigbo nghọtahie n’etiti ndị IPOB.
N’agbanyeghị na ozi nkagbu atụmatụ ahụ si n’aka Kanu, ụfọdụ ndị IPOB siri ọnwụ ịga n’ihu n’atụmatụ ahụ.
Ndị dị etu a hụtara Ọkaiwu Ejimakọ dịka ótù onye n’ime ndị kwadoro nkagbu ya bụ atụmatụ.
Nke ka njọ bụ na ụfọdụ n’ime ha na – ebozi ya ebubo ịnara ego iji kwado nkagbu atụmatụ ahụ.
Kaosiladị, Ejimakọ jụrụ ha sị, ” Kedụ ka ndị mmadụ ga-esi na – akọ udiri akụkọ a. Ndị Ọkaiwu (Kanu) e nwere udiri ikike a(nkagbu atụmatụ IPOB dịka Onye Nọrọ Be Ya)?
“Ndị na-akụ asịrị a bụ ndị chọrọ itisa anyị”
Hmmm, obodo bụ ígwè! Nwannaa, Ejimakọ jisi ike, jirikwa akọ biko.
“Does it make any sense to say that ‘the Lawyers collected money to suspend the Sit At Home’? Do the Lawyers have such powers?