CHAI! NDI NCHE ÓGBÈ ỌGBARỤ AGBAGWUWO NWOKORỌBỊA NỌ MAHADUM, BO YA EBUBO
Ọnịcha – Ebelebe gburu n’Akili-Ozizor dị n’Okpuru Ọchịchị Ọgbarụ na Steeti Anambara, oge ndi nche ógbè gbagburu nwokorọbịa nọ na Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu, Igbariam.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ndị nche ógbè nọ n’Ogige Obibi (Housing Estate) nke Sinetọ Oduah gbagburu, Noel Okechukwu, onye dị afọ iri abụọ na asaa.
Ha boro ya bụ nwata akwụkwọ nọ n’afọ ikpeazụ na mahadum ebubo iso emebisi ma zukwaa akara ngwa dị n’ogige obibi ahụ.
Kaosiladị, ndi mụrụ ya bụ nwaamadị laworo mmụọ kwuru na nke ahụ asị, na ha dinyere ya ka ọ ga zụta azụ n’ogige obibi ahụ oge ndi nche ógbè ahụ jiri kwụsị ya n’ọnụ ụzọ ámá ogige obibi ahụ; were meminaa ya ka ya na ha bawara mba.
Nna ya, Rex Okechukwu, kwuru na o wegawo okwu ahụ n’aka ndi Uweojii, Ngalaba Atani, Okpuru Ọchịchị Ọgbarụ, Steeti Anambara
“Ka ha gbara ya égbè, ha chọrọ ịkpọte ya site na inye ya mmiri ọṅụṅụ mana o kubeziri, nwụọ”
Onye Nlekọta Ụlọ ọrụ ndị Uweojii n’Okpuru Ọchịchị Ọgbarụ, Mazị I. Andrew kwuru na ozi ha nwetara na-egosi na ya bụ nwata akwụkwọ laworo mmụọ so na ndi omekome na abịa emebisi ma zukwaa akara ngwa nakwa ngwongwo nọ n’Ogige Obibi ahụ.
O kwukwara na a sị na ya bụ nwata akwụkwọ na ndi òtù ya bu ụzọ gbawa ndi nche ahụ égbè mere ha jiri kwarịta mgbọ, ebe a nọrọ gbagbuo ya.
Chai! Nwa bịara ụwa! Onye nwụrụ anwụ anaghị ekwu okwu