AKỤKỌ ỤWA

CHAI! NWANYỊ ABỤJA “ONYE BARROW” BURU IHE Ọ ZỤTARA N’AHỊA GBALAGA EBEELA ÁKWÁ ARỊRỊ

Abụja – Ótù nwanyị, Rebecca Gbaje ebeela ákwá arịrị ka ‘onye barrow’ buru ihe ọ zụtachara n’ahịa Kwara dị na mpaghara Kwali n’Abụja gbalaga.

Ákwá nwanyị bere metụrụ ndị gbakọtara ebe ahụ n’obi mere ụfọdụ jiri chọrọ ‘onye barrow’ onye ohi ahụ gagharịwa mana ha enwetaghị ya.

Oriakụ kwuru na ji ego ya ahụghí ahụ were zụta ngwa nri dịka osikapa, àgwà, ọ́kà, wdg maka ezinụlọ ya.

Ọ sịrị na ya gwara ‘onye barrow’ ahụ chere ka ọ zụta azụ mana na onye ohi ahụ buru ibu ya gbalaga ka ọ nọ na -èkwé azụ ọnụ.

O kwukwara na ihe ọ zụtara pụtara Naira Puku iri abụo na atọ na narị atọ (N23, 300).

Ndị ahịa ụfọdụ tụkọtazịrị ego ole ha nwere ike nye ya ka ọ mara ihe ọ ga-ejinwu ya zụta ka ụmụ ya ghara ịkwụ agụ.

Chai! N’ọchịchị Tinubu a? Onye barrow nke a afọ tara gị mmiri.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close