CHAI! NWATA AKWỤKWỌ EJIRIWO ỌKPỌ KỤGBUO ONYE NKUZI PỊARA NWANNE YA ỤTARỊ


Wọrị: Ụbọchị Tọzdee, n’Abraka dị n’Okpuru Ọchịchị Ọwụwa Anyanwụ Ethiope na Delta Steeti, Maịkel Ogbeise, Nwata akwụkwọ Sekọndịrị etigbunyụọla ótù ònye nkuzi anya maka ịpịa obere nwanne ya nwaanyị bụ Promise ụtarị.
Onye nkụzi ahụ laworo mmụọ bụ Josefụ, site n’ozi hoo!haa!! nwetara pịara Promise Ogbeise ụtarị maka ịlụ ọgụ. Nke a mere Maịkel nwanne ya, onye nọ n’afọ ikpeazụ nke agụ akwụkwọ Sekọndịrị (SS3) jiri wakpo nwaamadị ahụ n’ogige ndị nkuzi (staff room), wee were ọkpọ kụrie onye nkuzi ahụ akụri.
Nwoke ahụ nọzị ụlọ ọgwụ were kubee. Ka ọ dị ugbu a, e ji Promise eji mana enwetabeghi nwanne ya nwoke bụ Maịkel.
DSP Bright Edafe, Ọnụ na – ekwuru Ndị Uwe Ojii na steeti ahụ kwuru na a ka na-achọ nwatakịrị ogbu ọchụ ahụ achọ.