AKỤKỌ ỤWA
CHAI! NWOKE EBEELA ENYI YA NWANYỊ ISI N’OKPORO ỤZỌ N’IHU NDỊ MMADỤ


Ótù nwata nwanyị dị afọ iri ise na ise, Mafalda Thayer ka enyi ya nwoke, Alexis Sobrite, onye dị afọ iri anọ n’abụọ nọrọ ụbọchị Wenzdee, abalị iri abụọ n’asatọ nke ọnwa Julaị afọ a were sụgbuo ma bekwaa ya isi n’etiti ehihie na Shakopee, Minneapolis dị na Minnesota mba Amerịka.

Alexis, onye ndị mmadụ kwuru na etibu ya bụ enyi ya nwanyị ihe kwa mgbe kwa mgbe, wakporo ya bụ nwanyị na njekọrịta ụzọ (Junction).
Ndị hụrụ ya bụ ihe ọjọọ na-eme kpọrọ ndị Uwe Ojii n’ekwentị. Kaosiladi, tupu ha na-erute, Alexis agbalagala ebe ozu Mafalda na isi tọgbọzị.
Ndi Uwe Ojii nwụchikọrọ ogbu ọchụ ahụ ka o ji a gbalaga. A hụkwara mma o jiri kpaa mkpa mkpa ahụ.
O kwuru na ihe bụ iwe ya bụ na Mafalda sịrị na ọ chọghịkwa mmekọ ha abụọ.