“CHARLIE NWA MGBAFỌ” ETURUWO UGO NA NHỌPỤTA GỌVANỌ ANAMBARA STEETI



Ọka: Ọkammụta Chukwuma Soludo (Charlie Nwa Mgbafọ) eturuwo ugo na Nhọpụta Gọvanọ Anambara Steeti.
Nkea bụ site na mpụtara Nhọpụta (Election Results) ahụ nke Onye Nhazi Mpụtara Nhọpụta (Returning Officer), Ọkammụta Flọrịns Obi, onye bụkwa Onyeisi Mahadum Kalaba gụpụtara n’isi ụtụtụ taa bụ Wenezdee n’ogige ụlọ ọrụ na-ahụ maka Nhọpụta bụ Independent National Electoral Commission(INEC) n’Ọka, Anambara Steeti.
Ọkammụta Obi kwuru sị “Gị bụ Chals Chukwuma Soludo nke APGA, site na imezu ihe nile iwu kwuru abụrụwo onye nwere mmeri na Nhọpụta a”
Soludo, onye ụfọdụ aha eji mara ya bụ “Soludo Solution” nakwa “Charlie Nwa Mgbafọ” bụ onye wuru ewu oge ọ bụ Gọvanọ, Ụlọ Akụ Etiti Naijiria maka ọmarịcha atụmatụ dị iche iche o wepụtara iji kwalite ọnọdụ akụnụba ala Naịjiria.
O meriri n’Okpuru Ọchịchị iri na asaa tinyere Ihiala, ebe INEC mere Nhọpụta mmezu ụbọchị Tuuzdee, ebe Ichie Val Ozigbo nke òtù ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) na Sinetọ Ifeanyi Ụba nke òtù ndọrọndọrọ ọchịchị Young Progressives Party (YPP) meriri na sọọsọ ótù Okpuru Ọchịchị, ya bụ Ọgbarụ na Mgbago Úgwù Nnewi, n’ótù n’ótù.
Kaosiladị, Sinetọ Andy Ụba nke òtù ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) achịtaghị ájá ọbụla chaa chaa n’Okpuru Ọchịchị ọbụla.
Lezie Mpụtara Nhọpụta ahụ:
APGA 112,229
PDP 53,807
APC 43,285
YPP 21,261



