ASỊRỊ

CHIỌMA DAVIDO A DỊ IME ỌZỌ?

Chiọma Avril Rowland dịkwa ka ọ dị ime ọzọ.

Onyonyoo ya, o tinyere ikpeazụ na nsapete ya n’Instagram gosiri na “o rijuola afọ”.

Kemgbe Ada Imo Steeti a bidoro tọwa, o nweghị onye ma ma ha abụ dị na nwunye ka ha aka na-eme ọyị.

Afọ gara aga, Davido kwuru okwu ịlụ Chiọma. E nwekwara onyonyoo na-egosi na ya bụ odogwu nwoke ụmụ asa na-anwụrụ bịara hụ ndị be Chiọma.

Kaosiladi, ihe mgbagwoju anya bụ na akwụkwọ akụkọ ụfọdụ na akpọ Chiọma nwunye Davido ebe ụfọdụ na – akpọ ya enyi ya nwanyị.

Hmmm, ime nkea, onye makwa ya ọ bụ Davido nwe ya ka aka Peruzzi adịkwa na ya dịka e siri boo ebubo na ọ bụ ya nyere gol nke gara aga, na ọ bụghị Davido.

Show More

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close